Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 58

E Bibiri Jeruselem

E Bibiri Jeruselem

Ndị Juda kwụsịrị ife Jehova ọtụtụ ugboro ma fewe chi ọzọ. Jehova gbalịrị inyere ha aka ruo ọtụtụ afọ. O zigara ọtụtụ ndị amụma ka ha dọọ ha aka ná ntị, ma ha egeghị ha ntị. Kama, ha chịrị ha ọchị. Olee otú Jehova si mee ka ha kwụsị ikpere arụsị?

N’oge ahụ, eze Babịlọn bụ́ Nebukadneza nọ na-alụso obodo dị iche iche agha, na-emerikwa ha. Oge mbụ o meriri Jeruselem, o jidere Eze Jehoyakin, ndị isi Juda, ndị agha ha na ndị omenkà ha, ma kpụrụ ha niile laa Babịlọn. O buuru ihe niile dị oké ọnụ ahịa dị n’ụlọ nsọ Jehova. Nebukadneza meziri Zedekaya eze Juda.

Mgbe Zedekaya malitere ịchị Juda, o rubeere Nebukadneza isi. Ma, obodo ndị nọ Juda nso na ndị amụma ụgha gwara ya ka o nupụrụ ya isi. Jeremaya gwara Zedekaya, sị: ‘Ọ bụrụ na i nupụrụ ya isi, ndị mmadụ ga na-egbu ibe ha na Juda, nri ga-akọ, ndị mmadụ ga na-arịakwa ọrịa.’

Mgbe Zedekaya chịchara afọ asatọ, o nupụụrụ eze Babịlọn isi. Ọ gwara ndị agha Ijipt ka ha bịa nyere ya aka. Nebukadneza zigara ndị agha ya ka ha gaa buso Jeruselem agha. Ndị agha ya gara gbaa Jeruselem gburugburu. Jeremaya gwara Zedekaya, sị: ‘Jehova kwuru na ọ bụrụ na ị chịliere ndị Babịlọn aka elu, ha agaghị egbu gị, ha agaghịkwa ebibi Jeruselem. Ma ị jụ, ndị Babịlọn ga-agba Jeruselem ọkụ, dọrọkwa gị n’agha.’ Zedekaya gwara Jeremaya, sị: ‘Agaghị m achịliri ha aka elu.’

Mgbe otu afọ na ọnwa isii gachara, ndị agha Babịlọn bịara kwatuo mgbidi Jeruselem, gbaakwa obodo ahụ ọkụ. Ha gbara ụlọ nsọ ya ọkụ, gbuo ọtụtụ ndị, dọrọkwa ọtụtụ n’agha laa Babịlọn.

Zedekaya gbawara ọsọ, ma ndị agha ahụ chụwara ya, jide ya. Ha jidere ya n’ebe dị nso na Jeriko, ma kpụgara ya Nebukadneza, eze Babịlọn. Nebukadneza gburu ụmụ Zedekaya n’ihu ya. Ọ rụkpọrọ Zedekaya anya, ma tinye ya n’ụlọ mkpọrọ, ya emechaa nwụọ. Ma, Jehova kwere ndị Juda nkwa, sị: ‘Afọ iri asaa gachaa, m ga-eme ka unu laghachi na Jeruselem.’

Olee ihe ga-eme ụmụ okorobịa so na ndị a dọọrọ n’agha gaa Babịlọn? Hà ga na-erubere Jehova isi?

“Jehova Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Niile, mkpebi ikpe gị bụ eziokwu, bụrụkwa ihe ziri ezi.”—Mkpughe 16:7