Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 61

Ha Akpọghị Isiala

Ha Akpọghị Isiala

Obere oge Nebukadneza rọchara nrọ nnukwu ihe ahụ a kpụrụ akpụ, o ji ọlaedo kpụọ otu nnukwu ihe yiri mmadụ. Ọ kpụrụ ya na mbara ala Dura ma kpọọ ndị niile a ma ama n’obodo ya ka ha bịa kwụrụ n’ihu ihe ahụ ọ kpụrụ. Shedrak, Mishak, na Abednego sokwa na ndị ọ kpọrọ. Eze gwara ndị ahụ niile, sị: ‘Ozugbo unu nụrụ ụda opi, ụbọ akwara na nnukwu ọjà, daanụ n’ala kpọọrọ ihe a m kpụrụ isiala. A ga-atụba onye ọ bụla na-adaghị n’ala kpọọ isiala n’oké ọkụ a kwanyere.’ Ụmụ okorobịa Hibru atọ a hà ga-akpọrọ ihe ahụ isiala, ka hà ga-efe naanị Jehova?

Eze gwaziri ndị na-akụ egwú ka ha kụwa egwú. Ozugbo ndị niile nọ ebe ahụ nụrụ ụda egwú, ha dara n’ala kpọọrọ ihe ahụ isiala. Ma Shedrak, Mishak na Abednego akpọrọghị ihe ahụ isiala. Ndị hụrụ ha, gwara eze, sị: ‘Ndị Hibru atọ ahụ akpọrọghị ihe ahụ ị kpụrụ isiala.’ Nebukadneza nyere iwu ka a kpọta ha. Mgbe ha rutere, ọ gwara ha, sị: ‘M ga-enye unu ohere ọzọ ka unu kpọọrọ ihe a m kpụrụ isiala. Unu jụ, m ga-atụba unu n’oké ọkụ ahụ. E nweghị chi ga-anapụtali unu n’aka m.’ Ha gwara ya, sị: ‘Ọ baghị uru inyewe anyị ohere ọzọ. Chineke anyị ga-anapụtali anyị. Ma, ọ bụrụ na ọ napụtaghị anyị, mara amara, eze, na anyị agaghị akpọrọ ihe a ị kpụrụ isiala.’

Ezigbo iwe were Nebukadneza. Ọ gwara ndị na-ejere ya ozi, si: ‘Meenụ ka ọkụ ahụ dị ọkụ okpukpu asaa karịa otú ọ dịbu.’ Ọ gwaziri ndị agha ya, sị: ‘Keenụ ha agbụ ma tụba ha n’ime ọkụ.’ Ọkụ ahụ bịara dị oké ọkụ nke na mgbe ndị agha bu ha bịaruru nso ka ha tụba ha n’ọkụ ahụ, ukoro ọkụ regburu ndị agha ahụ. Ndị Hibru atọ ahụ adaba n’ime ọkụ ahụ. Ma, mgbe Nebukadneza lere anya n’ime ọkụ ahụ, kama ịhụ ụmụ nwoke atọ, ọ hụziri ụmụ nwoke anọ na-agagharị n’ime ya. Ụjọ jidere ya, ya ajụọ ndị na-ejere ya ozi, ọkwá ha dị elu, sị: ‘Ọ́ bụghị ụmụ nwoke atọ ka anyị tụbara n’ọkụ? M na-ahụ ụmụ nwoke anọ, otu n’ime ha yikwara mmụọ ozi.’

Nebukadneza gara nso n’ebe ahụ a kwanyere ọkụ, were olu dara ụda gwa ha, sị: ‘Pụtanụ, unu ndị ohu Chineke, Onye Kasị Elu.’ O juru onye ọ bụla nọ ebe ahụ anya na Shedrak, Mishak na Abednego si n’ọkụ ahụ pụta, n’enweghị ihe mere ha. Ọkụ ahụ ereghị ahụ́ ha, isi ha na uwe ha. Ha anaghịkwa esi ọkụ ọkụ.

Nebukadneza kwuru, sị: ‘Chineke Shedrak, Mishak na Abednego dị ukwuu. O zitere mmụọ ozi ya ma napụta ha. E nweghị chi ọzọ dị ka Chi ha.’

Ị̀ ga-erubere Jehova isi otú ahụ ndị Hibru atọ ahụ mere, ihe ọ sọkwara ya mee?

“Ọ bụ Jehova bụ́ Chineke gị ka ị na-aghaghị ife ofufe, ọ bụkwa naanị ya ka ị na-aghaghị ijere ozi dị nsọ.”—Matiu 4:10