Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 62

Alaeze E Ji Tụnyere Nnukwu Osisi

Alaeze E Ji Tụnyere Nnukwu Osisi

E nwere otu abalị Nebukadneza rọrọ nrọ na-atụ ezigbo ụjọ. Mgbe o tetara, ọ kpọrọ ndị amamihe ya ka ha kọwaara ya nrọ ahụ. Ma enweghị onye n’ime ha nwere ike ịkọwa ya. Eze mechara gwa Daniel ka ọ kọwaara ya ihe nrọ ahụ pụtara.

Nebukadneza gwara Daniel, sị: ‘Ná nrọ ahụ m rọrọ, ahụrụ m otu osisi. Osisi ahụ toro ezigbo ogologo nke na o ruru n’eluigwe. E nwekwara ike ịnọ ebe ọ bụla n’ụwa hụ ya. Akwụkwọ ya mara mma, mkpụrụ ya dịkwa ọtụtụ. Anụ ọhịa na-anọ n’okpuru ya ezu ike, nnụnụ kpakwara akwụ́ n’alaka ya. Mgbe m nọ na-ele ihe ndị a, otu mmụọ ozi si n’eluigwe gbadata. O kwuru, sị: “Gbutuonụ osisi ahụ, gbukapụsịanụ alaka ya. Ma hapụnụ úkwù osisi ahụ na mgbọrọgwụ ya n’ala, keekwanụ ya agbụ ígwè na agbụ ọla kọpa. Ka a gbanwee obi osisi ahụ ka ọ ghara ịbụkwa obi mmadụ, kama, ka ọ bụrụ obi anụ ọhịa, ka oge asaa gabiga n’isi ya. Mmadụ niile ga-amara na Chineke bụ Onye Na-achị Achị, o nwekwara ike inye onye ọ bụla ọ chọrọ alaeze.”’

Jehova mere ka Daniel ghọta ihe nrọ ahụ pụtara. Mgbe ọ ghọtara ya, ezigbo ụjọ tụwara ya. O kwuru, sị: ‘Ọ dị m ka nrọ a bụrụ maka ndị iro gị, ma Eze, ọ bụ maka gị. A ga-anapụ gị alaeze gị, ị ga na-atakwa ahịhịa n’ọhịa ka anụ ọhịa. Ma, ebe ọ bụ na mmụọ ozi ahụ kwuru ka a hapụ úkwù osisi ahụ na mgbọrọgwụ ya, ị ga-emecha bụrụ eze ọzọ.’

Mgbe otu afọ gachara, Nebukadneza nọ na-agagharị n’obí ya, na-ele otú Babịlọn si maa mma. O kwuru, sị: ‘Legodị obodo a m rụrụ, ọ mara ezigbo mma. O nweghị onye dị ka m.’ Ka ọ nọ na-ekwu ihe ndị a, otu olu si n’eluigwe gwa ya, sị: ‘Nebukadneza, a napụla gị alaeze gị.’

Ozugbo a gwachara Nebukadneza okwu ahụ, ọ maghịzi onwe ya, ya emewe ka anụ ọhịa. A chụpụrụ ya n’obí ya, chụga ya n’ọhịa ya na anụ ọhịa ebiri. Ntụtụ isi ya bịara too ogologo ka ábụ́bà ugo, mbọ́ ya adịkwa ka mbọ́ nnụnụ.

Mgbe ọ nọchara n’ọhia afọ asaa, o nwetaghachiri onwe ya, Jehova emeekwa ka ọ bụrụ eze ọzọ. Nebukadneza kwuziri, sị: ‘M na-eto Jehova, bụ́ Eze eluigwe. Ugbu a ka m matara na Jehova bụ Onye Na-achị Achị. Ọ na-eweda ndị na-ebuli onwe ha elu, ala. O nwekwara ike inye onye ọ bụla ọ chọrọ alaeze.’

“Nganga na-abịa tupu nkụpịa, mmụọ mpako na-abịakwa tupu ịsụ ngọngọ.”—Ilu 16:18