Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 63

Ihe E Dere n’Ahụ́ Ájá

Ihe E Dere n’Ahụ́ Ájá

Mgbe Nebukadneza nwụrụ, Belshaza nwa ya, ghọrọ eze Babịlọn. N’otu abalị, ọ kpọrọ otu puku ndị a kacha asọpụrụ na Babịlọn oriri. Ọ gwara ndị na-ejere ya ozi ka ha wepụta iko ọlaedo ndị Nebukadneza chịịrị n’ụlọ nsọ Jehova. Belshaza na ndị ahụ ọ kpọrọ oriri malitere iji iko ndị ahụ na-aṅụ mmanya ma na-eto chi ha. Ka ha nọ na-eme ihe ndị a, ha hụrụ otu aka malitere ide ihe n’ahụ́ ájá. E nweghịkwa onye nwere ike ịgụta ihe a na-ede.

Ezigbo ụjọ bịara Belshaza. Ọ kpọrọ ndị anwansi ya ma gwa ha, sị: ‘Ọ bụrụ na e nwee onye ga-akọwara m ihe ihe a e dere pụtara, m ga-eme ya onye nke atọ na Babịlọn.’ Ha gbalịrị ka ha kọwaa ya, ma o nweghị onye n’ime ha nweliri ike ịkọwa ya. Nwunye Belshaza batara ma gwaa ya, sị: ‘E nwere otu nwoke aha ya bụ Daniel, onye na-akọwara Nebukadneza nrọ ya. Ọ ga-akọwali ihe ndị ahụ e dere.’

A kpọtara Daniel n’ihu eze Belshaza, ya agwa ya, sị: ‘Ọ bụrụ na i nwee ike ịgụ ihe a e dere ma kọwaa ha, m ga-enye gị ihe olu ọlaedo, meekwa gị onye nke atọ na Babịlọn.’ Daniel zara ya, sị: ‘Achọghị m onyinye gị, mana m ga-akọwara gị ihe okwu ndị ahụ pụtara. Nebukadneza nna gị buliri onwe ya elu, ma Jehova wedara ya ala. Ị ma ihe niile mere ya. Gịnị mere i ji were iko ọlaedo si n’ụlọ nsọ Jehova ṅụọ mmanya? Ihe a i mere gosiri na ị kwanyereghị Jehova ùgwù. Ọ bụ ya mere Chineke ji dee okwu ndị a: Mini, Mini, Tikel na Pasịn. Ihe okwu ndị a pụtara bụ na ndị Midia na ndị Peshia ga-emeri Babịlọn, ị gaghịzi abụ eze.’

Otú obodo Babịlọn dị mere ka o yie ka e nweghị onye ga-emerili ya. Nnukwu mmiri gbara ya gburugburu, e jikwa nnukwu mgbidi gbaa ya gburugburu. Ma, n’abalị ahụ Belshaza kpọrọ oriri ahụ, ndị Midia na ndị Peshia bịara ịlụso ha agha. Saịrọs, Eze Peshia mere ka mmiri ahụ gbara Babịlọn gburugburu sọrọ gawa ebe ọzọ, ka ndị agha ya nwee ike iji ụkwụ ruo n’ọnụ ụzọ e si abanye n’obodo ahụ. Mgbe ha rutere, ọnụ ụzọ ahụ mepere emepe. Ndị agha ahụ banyere na Babịlọn merie ha, gbuokwa eze ha. Saịrọs maliteziri ịchị Babịlọn.

Mgbe Saịrọs chịrị ihe dị ka otu afọ, o kwuru, sị: ‘Jehova gwara m rụghachi ụlọ nsọ ya dị na Jeruselem. Onye ọ bụla n’ime ndị ya chọrọ ịga nye aka rụghachi ya, nwere ike ịga.’ N’ihi ya, ọtụtụ ndị Juu laghachiri Jeruselem mgbe afọ iri asaa e bibiri Jeruselem gachara, otú ahụ Jehova kwuru. Saịrọs chịghachiri iko ọlaedo na ọlaọcha na ihe ndị ọzọ Nebukadneza chịịrị n’ụlọ nsọ Chineke. Ị̀ hụrụ otú Jehova si jiri Saịrọs napụta ndị Juu?

“Ọ dawo! Babịlọn Ukwu ahụ adawo, ọ ghọwokwa ebe obibi nke ndị mmụọ ọjọọ.”—Mkpughe 18:2