Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 64

A Tụbara Daniel n’Olulu Ọdụm

A Tụbara Daniel n’Olulu Ọdụm

E nwere eze ọzọ chịrị Babịlọn. Aha ya bụ Darayọs, onye Midia. Darayọs chọpụtara na Daniel pụrụ iche. O mere ya onyeisi nke ndị ọkwá ha dị elu na Babịlọn. Ndị a ọkwá ha dị elu na-enwere Daniel anyaụfụ, ma na-achọ otú ha ga-esi gbuo ya. Ha ma na Daniel na-ekpe ekpere ugboro atọ n’ụbọchị. Ọ bụ ya mere ha ji gwa Darayọs, sị: ‘Eze, e kwesịrị ime iwu ga-ekwu na ọ bụ naanị gị ka a ga na-arịọ arịrịọ. A ga-atụba onye ọ bụla dara iwu a n’olulu ọdụm.’ Ihe a ha kwuru masịrị Darayọs, ya ekweta ka e mee iwu ahụ, bịanyekwa aka n’akwụkwọ iwu ahụ.

Ozugbo Daniel nụrụ iwu a e nyere, ọ lara n’ụlọ ya. O mepere windo ụlọ ya, gbuo ikpere n’ala, rịọwa Jehova arịrịọ. Ndị ahụ na-emere ya anyaụfụ kwooro bịa n’ụlọ ya, hụ ya ebe ọ na-ekpe ekpere. Ha gbaara gakwuru Darayọs, gwa ya, sị: ‘Daniel emeghị ihe ahụ i nyere n’iwu. Ọ na-arịọ Chineke ya arịrịọ ugboro atọ n’ụbọchị.’ Darayọs hụrụ Daniel n’anya, ọ chọghịkwa ka e gbuo ya. Si n’ụtụtụ ruo n’abalị, ọ nọ na-eche ihe ọ ga-eme ka a ghara igbu Daniel. Ma, Darayọs enwedịghị ike ịgbanwe iwu ọ bịanyerela aka na ya. N’ihi ya, ọ gwara ha ka ha tụba Daniel n’olulu ọdụm.

Darayọs ehighị ụra n’abalị ahụ ebe ọ na-eche banyere Daniel. N’ụtụtụ echi ya, ọ gbaara ọsọ gaa n’ọnụ olulu ahụ ma kpọọ Daniel òkù, sị: ‘Chineke gị ọ̀ napụtara gị?’

Darayọs nụrụ olu n’olulu ahụ. Ọ bụ olu Daniel. Daniel gwara ya, sị: ‘Mmụọ ozi Jehova mechiri ọnụ ọdụm ndị a. Ha emeghị m ihe ọ bụla.’ Obi tọrọ Darayọs ezigbo ụtọ. O nyere iwu ka a kpọpụta Daniel n’olulu ọdụm ahụ. Mgbe Daniel pụtara, o nweghị ihe ọ bụla mere ya. Eze nyeziri iwu, sị: ‘Tụbanụ ndị ahụ boro Daniel ebubo n’olulu ọdụm ahụ.’ Mgbe a tụbara ha n’olulu ahụ, ọdụm ndị ahụ dọriri ha.

Darayọs nyere ndị niile ọ na-achị iwu, sị: ‘Ka mmadụ niile na-atụ Chineke Daniel egwu. Ọ napụtara Daniel n’aka ọdụm.’

Ị̀ na-ekpe ekpere kwa ụbọchị ka Daniel?

“Jehova maara otú o si anapụta ndị na-asọpụrụ Chineke n’ọnwụnwa.”—2 Pita 2:9