Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 65

Esta Anapụta Ndị Obodo Ha

Esta Anapụta Ndị Obodo Ha

Esta bụ nwa agbọghọ onye Juu. Ha bi n’obodo Shushan dị na Peshia. Ọtụtụ afọ tupu mgbe ahụ, ezinụlọ ha so ná ndị Nebukadneza si na Jeruselem dọrọ n’agha. Ọ bụ nwa nwanne papa Esta aha ya bụ Mọdekaị zụrụ ya. Mọdekaị na-ejere eze ndị Peshia aha ya bụ Ahazuirọs ozi.

Eze Ahazuirọs chọrọ ịlụ nwaanyị ọhụrụ. Ndị na-ejere ya ozi kpọtaara ya ụmụ nwaanyị ndị kacha maa mma n’obodo Peshia. Esta sokwa ná ndị a kpọtaara ya. N’ime ụmụ nwaanyị niile a kpọtaara ya, eze họọrọ Esta ka ọ bụrụ nwunye ya. Mọdekaị gwara Esta ka ọ ghara ịgwa onye ọ bụla na ọ bụ onye Juu.

Otu nwoke aha ya bụ Heman bụ onyeisi nke ndị isi niile e nwere na Peshia. Nwoke a bụ onye okomoko. Ọ chọrọ ka onye ọ bụla na-akpọrọ ya isi ala. Mọdekaị ekweghị akpọrọ ya isi ala, ezigbo iwe ewee ya nke na ọ chọwara igbu ya. Mgbe Heman chọpụtara na Mọdekaị bụ onye Juu, ọ haziri otú a ga-esi egbu ndị Juu niile bi na Peshia. Ọ gwara eze, sị: ‘Ndị Juu bụ ndị ọjọọ. I kwesịrị igbu ha niile.’ Ahazuirọs gwara ya, sị: ‘Mee ihe ọ bụla ị chọrọ ime.’ O nyekwara Heman ikike ime iwu maka ihe ọ chọrọ ime. Heman mere iwu kwuru ka e gbuo ndị Juu niile n’abalị iri na atọ nke ọnwa ndị Juu a na-akpọ Eda. Jehova nọ na-ele ihe na-emenụ.

Esta amaghị banyere iwu a. N’ihi ya, Mọdekaị zigaara ya akwụkwọ iwu ahụ, ma gwa ya, sị: ‘Gaa gwa eze ihe na-emenụ.’ Esta gwara ya, sị: ‘Ọ bụrụ na mmadụ agaa ịhụ eze ma eze akpọghị ya, a ga-egbu ya. Eze akpọbeghị m ka m bịa hụ ya kemgbe abalị iri atọ ugbu a. Ma, m ga-aga hụ ya. Ọ bụrụ na o setịara m mkpanaka ya, a gaghị egbu m. Ọ bụrụkwanụ na o setịghịrị m mkpanaka ya, a ga-egbu m.’

Esta mechara gawa n’obí eze. Mgbe eze hụrụ ya, ya esetịara ya mkpanaka ya. Ọ gakwuuru eze, eze ajụọ ya, sị: ‘Esta, gịnị ka m ga-emere gị?’ Esta gwara ya, sị: ‘M ga-achọ ka gị na Heman bịa oriri n’ụlọ m.’ Ka ha nọ na-eri ihe, Esta kpọkwara ha oriri ọzọ. Mgbe ha gara, eze jụrụ Esta ọzọ, sị: ‘Gịnị ka m ga-emere gị?’ Esta gwara ya, sị: ‘E nwere onye chọrọ igbu mụ na ndị obodo anyị. Biko, napụta anyị.’ Eze jụrụ ya, sị: ‘Ònye chọrọ igbu gị?’ Esta gwara ya, sị: ‘Ọ bụ Heman ọjọọ a.’ Ezigbo iwe were Ahazuirọs nke na o nyere iwu ka e gbuo Heman ozugbo.

Ma, ọ dịghị onye nwere ike ịkagbu iwu ahụ Heman mere. Eze enwedịghị ike ịkagbu ya. Eze meziri Mọdekaị onyeisi nke ndị isi niile e nwere na Peshia ma nye ya ikike ime iwu ọhụrụ. Mọdekaị mere iwu nke nyere ndị Juu ikike igbu onye ọ bụla bịara igbu ha. Ndị Juu meriri ndị iro ha n’abalị iri na atọ nke ọnwa Eda. Kemgbe ahụ, ha na-eme ememme kwa afọ iji cheta ụbọchị ahụ ha meriri.

“A ga-akpụpụta unu n’ihu ndị gọvanọ na ndị eze n’ihi m, ka ọ bụrụ àmà nye ha na ndị mba ọzọ.”—Matiu 10:18