Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 66

Ezra Kụziri Iwu Chineke

Ezra Kụziri Iwu Chineke

O ruola afọ iri asaa kemgbe ọtụtụ ndị Izrel si Babịlọn laghachi Jeruselem. Ma, a ka nwere ụfọdụ n’ime ha bi n’obodo dị iche iche ndị Peshia na-achị. Otu n’ime ha bụ onye nchụàjà aha ya bụ Ezra. Ọ kụziiri ndị Izrel Iwu Jehova. Mgbe Ezra nụrụ na ndị Izrel bi na Jeruselem anaghị edebe Iwu Jehova, ọ chọrọ ka ya gaa nyere ha aka. Atazaksis, eze Peshia gwara ya, sị: ‘Chineke gị nyere gị amamihe ka ị na-akụzi Iwu ya. Gaa, kpọrọ ndị niile chọrọ iso gị laa, lawa.’ Ezra gakwuuru ndị Izrel niile chọrọ ịlaghachi Jeruselem. Ha rịọrọ Jehova ka o duo ha ka ihe ọjọọ ghara ime ha n’ụzọ. Mgbe ha kpechara ekpere, ha lawara.

O were ha ọnwa anọ isi Babịlọn rute Jeruselem. Ndị isi ndị Izrel gwara Ezra, sị: ‘Ndị Izrel enupụrụla Jehova isi. Ha lụrụ ụmụ nwaanyị ndị na-efe chi ọzọ.’ Gịnị ka Ezra mere? O gburu ikpere n’ala n’ihu ndị Izrel kpee ekpere, sị: ‘Jehova, i merela anyị ọtụtụ ihe ọma. Ma, anyị emehiela gị.’ Ha chegharịrị, ma, a ka kwesịrị inyere ha aka ka ha na-eme ihe dị mma. Ezra họpụtara ndị okenye na ndị ikpe ka ha lebara ihe ndị ahụ anya. Mgbe ha lebachara ha anya, ha malitere ịchụla ndị nwunye ha ahụ na-efe chi ọzọ. Ha mere ya ruo ihe karịrị ọnwa atọ.

Afọ iri na abụọ agaala kemgbe ahụ ndị Izrel chụlachara ndị nwunye ha na-anaghị efe Jehova. Ma, n’oge ahụ niile, ndị Izrel rụghachiri mgbidi Jeruselem. N’ihi ya, Ezra kpọkọtara ha n’ebe ọhaneze na-ezukọ ka ọ gụpụtara ha Iwu Chineke. Mgbe o mepere akwụkwọ iwu ahụ, ndị Izrel guzoro ọtọ. Ọ malitere ito Jehova, ndị Izrel eweliekwa aka ha elu iji gosi na ha kwenyere n’ihe ọ na-ekwu. Ezra gụpụtaziiri ha Iwu Chineke ma kọwaara ha ya. Ha gekwara ya ntị nke ọma. Ha kwetara na ha emehiela Jehova ọzọ, ma bee ákwá. N’echi ya, Ezra gụpụtakwuuru ha ihe e dere n’Iwu Chineke. Mgbe a na-agụrụ ha ihe ndị ahụ e dere n’Iwu, ha chọpụtara na ha kwesịrị ime Ememme Ụlọ Ndò n’oge na-adịghị anya. Ha bidoro ozugbo kwadebe maka ya.

Ndị Izrel mere ememme ahụ abalị asaa. Ha ṅụrịrị ọṅụ ma kelee Jehova maka otú o si mee ka ihe ndị ha kụrụ n’ubi mee nke ọma. Malite n’oge Jọshụa, enweghị Ememme Ụlọ Ndò ndị Izrel metụrụla yiri ya. Mgbe ha mechara ememme a, ha zukọtakwara, ma kpee ekpere. Ha kpere, sị: ‘Jehova, ọ bụ gị napụtara anyị mgbe anyị na-agbara ndị Ijipt ohu, nye anyị nri n’ọzara, nyekwa anyị ala a mara ezigbo mma. Ma, anyị na-emehie gị ugboro ugboro. I ziteere anyị ndị amụma gị ka ha dọọ anyị aka ná ntị, ma anyị egeghị ha ntị. Ị nọkwa na-enwere anyị ndidi. I mezukwara nkwa i kwere Ebreham. Ugbu a, anyị na-ekwe gị nkwa na anyị ga na-erubere gị isi.’ Ha dekwara nkwa a ha kwere Jehova n’akwụkwọ. Ndị isi ha, ndị Livaị, na ndị nchụàjà bịanyekwara aka na ya.

“Obi ụtọ na-adịrị ndị na-anụ okwu Chineke ma na-edebe ya.”​—Luk 11:28