Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 68

Elizabet Amụọ Nwa

Elizabet Amụọ Nwa

Mgbe ihe karịrị narị afọ anọ a rụghachichara mgbidi Jeruselem gachara, otu onye nchụàjà aha ya bụ Zekaraya na Elizabet nwunye ya biri n’ebe dị nso na Jeruselem. Ha amụtabeghị nwa kemgbe ọtụtụ afọ ha lụrụ. Otu ụbọchị, mgbe Zekaraya nọ n’ebe nsọ na-achụ àjà, otu mmụọ ozi bịakwutere ya. Aha mmụọ ozi ahụ bụ Gebriel. Mgbe Zekaraya hụrụ ya, ụjọ tụrụ ya. Ma, Gebriel gwara ya, sị: ‘Atụla ụjọ. M chọrọ izi gị ozi ọma si n’aka Jehova. Elizabet, nwunye gị, ga-atụrụ ime mụọ nwa nwoke. Aha ya ga-abụ Jọn. Jehova ahọrọla ya ka ọ rụọrọ ya ọrụ pụrụ iche.’ Zekaraya jụrụ ya, sị: ‘Ihe a ọ̀ ga-ekweli omume? Mụ na nwunye m akaala nká ịmụ nwa.’ Gebriel gwara ya, sị: ‘Chineke zitere m ka m zie gị ozi ọma a. Ma, ebe ọ bụ na i kwetaghị ihe m gwara gị, ị gaghị ekwu okwu ruo mgbe a mụrụ nwa ahụ.’

Zekaraya nọrọ n’ime ụlọ nsọ Chineke karịa ka ọ na-anọbu. Mgbe ọ pụtara, ndị nọ n’èzí na-eche ya chọrọ ịma ihe merenụ. Ma, Zekaraya enwelighị ike ikwu okwu. Naanị ihe ọ na-eme bụ iji aka ya na-agwa ha okwu. Ọ bụzi mgbe ahụ ka ndị ahụ matara na e nweela ozi Chineke ziri ya.

Obere oge, Elizabet tụụrụ ime, mụọ nwa nwoke otú ahụ mmụọ ozi ahụ kwuru. Ndị ikwu ya na ndị enyi ya bịara ka ha hụ nwa ahụ. Obi tọrọ ha ezigbo ụtọ mgbe ha hụrụ ya. Elizabet gwara ha, sị: ‘Aha ya bụ Jọn.’ Ha gwara ya, sị: ‘O nweghị onye nọ n’ezinụlọ unu aha ya bụ Jọn. Gụọnụ ya Zekaraya, aha papa ya.’ Ma, Zekaraya dere ihe a ga-akpọ ya n’akwụkwọ. O dere, sị: ‘Aha ya bụ Jọn.’ Ozugbo o dechara ihe a, ya ekwuwe okwu. Akụkọ gbasara nwa ahụ gazuru Judia niile. Ndị mmadụ nọkwa na-ajụ onwe ha, sị: ‘Gịnị ka nwa a ga-abụ ma o too?’

Zekaraya ejupụtazie na mmụọ nsọ, ma kwuo, sị: ‘Ka otuto dịrị Jehova. O kwere Ebreham nkwa na ya ga-ezite Mezaya, onye nzọpụta, ka ọ napụta anyị. Jọn ga-abụ onye amụma, ọ ga-edozikwa ụzọ maka ọbịbịa Mezaya.’

E nwekwara ihe ọma meere Meri, onye ikwu Elizabet. Ka anyị chọpụta ihe ọ bụ n’isiokwu na-esonụ.

“Ihe a agaghị ekwe omume n’ebe ụmụ mmadụ nọ, ma n’ebe Chineke nọ, ihe niile kwere omume.”—Matiu 19:26