Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 70

Ndị Mmụọ Ozi Emee Ka A Mata na A Mụọla Jizọs

Ndị Mmụọ Ozi Emee Ka A Mata na A Mụọla Jizọs

Mgbe Meri dị ime Jizọs, ya na Josef gara Betlehem, bụ́ obodo Josef. Ihe mere ha ji gaa bụ na Siza Ọgọstọs, onye na-achị Alaeze Rom, nyere iwu ka ndị Juu niile gaa n’obodo ha deba aha ha n’akwụkwọ. N’oge ahụ, Meri dị ime ọmụmụ.

Mgbe ha rutere Betlehem, ha gara nọrọ n’ụlọ anụ n’ihi na e nweghị ebe ọzọ ha hụrụ ha ga-anọ. Ọ bụ ebe ahụ ka Meri nọ mụọ Jizọs. Ọ fụrụ ya àkwà ma jiri nwayọọ nyiwe ya n’ihe e ji etinyere anụ ụlọ nri.

E nwere ndị ọzụzụ atụrụ bi n’ọhịa n’ebe dị nso na Betlehem na-azụ atụrụ ha n’abalị. Na mberede, otu mmụọ ozi guzoro ha n’akụkụ, ebube Jehova nwuru ka ìhè gburugburu ha. Ụjọ bịara ndị ọzụzụ atụrụ ahụ, ma mmụọ ozi ahụ gwara ha, sị: ‘Unu atụla ụjọ. M chọrọ izi unu ozi na-enye obi ụtọ. Taa, ka a mụrụ Mezaya na Betlehem.’ Mgbe o kwuchara ihe a, ọtụtụ ndị mmụọ ozi pụtara, na-ekwu, sị: ‘Otuto dịrị Chineke n’eluigwe, ka udo dịkwa n’elu ụwa.’ Mgbe ndị mmụọ ozi ahụ kwuchara ihe a, ha pụrụ n’anya. Gịnịzi ka ndị ọzụzụ atụrụ ahụ mere?

Ha gwara ibe ha, sị: ‘Ka anyị gawanụ Betlehem ozugbo.’ Ha gawara ozugbo ma hụ Meri na Josef na nwa ọhụrụ ha n’ụlọ anụ.

Ihe ahụ mmụọ ozi ahụ gwara ndị ọzụzụ atụrụ ahụ tụrụ onye ọ bụla nụrụ ya n’anya. Meri chebaara ihe ahụ mmụọ ozi ahụ gwara ya echiche, o chefughịkwa ya. Ndị ọzụzụ atụrụ ahụ mechara laghachi ebe ha na-azụ atụrụ ha. Mgbe ha na-ala, ha nọ na-ekele Jehova maka ihe niile o mere ka ha nụ ma hụ.

“Esi m n’ebe Chineke nọ bịa, m wee nọrọ n’ebe a. Abịaghịkwa m n’uche nke aka m ma ọlị, kama ọ bụ Onye ahụ zitere m.”—Jọn 8:42