Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 72

Mgbe Jizọs Dị Afọ Iri na Abụọ

Mgbe Jizọs Dị Afọ Iri na Abụọ

Josef na Meri na Jizọs nwa ha, nakwa ụmụ ha ndị nwoke na ndị nwaanyị ndị ọzọ bi na Nazaret. Josef bụ ọkwá nká, ọ bụkwa ya ka o ji enweta ego o ji azụ ezinụlọ ya. Ọ na-akụzikwara ha gbasara Jehova na Iwu ya. Ha na-aga n’ụlọ nzukọ mgbe niile ka ha fee Chineke. Ha na-agakwa Jeruselem otu ugboro n’afọ maka Ememme Ngabiga.

Mgbe Jizọs dị afọ iri na abụọ, ezinụlọ ha mere ogologo njem gaa Jeruselem otú ha si eme kwa afọ. Ndị mmadụ si ebe dị iche iche bịa Jeruselem maka Ememme Ngabiga, ya emee ka ndị mmadụ ju ebe niile. Mgbe e mechara ememme a, Josef na Meri na ọtụtụ ndị ikwu ha so na-ala, ha chere na Jizọs sokwa ha. Ka ha na-ala, ha chọrọ ya n’etiti ndị ikwu ha, ma ha ahụghị ya.

Josef na Meri laghachiri Jeruselem na-achọgharị Jizọs. Ha chọrọ ya abalị atọ, mechaa hụ ya n’ụlọ nsọ. Ha hụrụ ya ebe ọ nọ ọdụ n’etiti ndị na-akụzi ihe n’ụlọ nsọ, na-ege ha ntị nke ọma, ma na-ajụ ha ezigbo ajụjụ. Otú o si gee ha ntị na ajụjụ ndị ọ nọ na-ajụ ha masịrị ha nke na ha malitere ịjụ ya ajụjụ. Ihe Jizọs zara ha jukwara ha anya. Ha chọpụtara na ọ ma Iwu Jehova nke ọma.

Obi erughị Josef na Meri ala oge niile ahụ ha nọ na-achọ Jizọs. Ọ bụ ya mere Meri ji gwa Jizọs, sị: ‘Nwa m, mụ na papa gị nọ na-achọgharị gị. Olee ebe ị nọ kemgbe?’ Jizọs sịrị ha: ‘Ùnu amaghị na m ga-anọ n’ụlọ Nna m ebe a?’

Jizọs sooro ha lawa Nazaret. Josef kụziiri Jizọs ọrụ ịkwa nkà ahụ ọ na-arụ. Olee ụdị onye i chere Jizọs bụ mgbe ọ na-etolite? Mgbe ọ na-etolite, ọ na-enwekwu amamihe, ihe ya ana-adịkwa Chineke na ndị mmadụ mma.

“Chineke m, ime uche gị na-atọ m ụtọ,iwu gị dịkwa n’ime obi m.”—Abụ Ọma 40:8