Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 73

Jọn Akwadebe Ndị Mmadụ Maka Ọbịbịa Jizọs

Jọn Akwadebe Ndị Mmadụ Maka Ọbịbịa Jizọs

Jọn bụ nwa Zekaraya na Elizabet. Ọ ghọrọ onye amụma mgbe o toro. Jehova ji Jọn na-akụziri ndị mmadụ na Mezaya na-abịa. Jọn anọghị n’ụlọ nzukọ ma ọ bụ n’obodo na-akụziri ndị mmadụ ihe, kama, ọ nọ n’ala ịkpa. Ndị mmadụ si na Jeruselem na Judia niile na-abịa ka Jọn kụziere ha ihe. Ọ gwara ha na ọ bụrụ na ha chọrọ ime ihe Chineke chọrọ, ha kwesịrị ịkwụsị ihe ọjọọ ha na-eme. Mgbe ọtụtụ ndị gechara Jọn ntị, ha chegharịrị ná mmehie ha, ya emeekwa ha baptizim n’Osimiri Jọdan.

Jọn anaghị ebi ndụ okomoko. Ọ na-eyi uwe e ji ajị́ kamel mee. Ihe ọ na-eri bụ igurube na mmanụ aṅụ. Ndị mmadụ chọsiri ike ịma onye Jọn bụ. Ndị Farisii na ndị Sadusii bịakwutedịrị ya. Jọn gwara ha, sị: ‘Unu kwesịrị ịkwụsị ihe ọjọọ unu na-eme ma chegharịa. Unu echela na unu pụrụ iche n’ihi na unu na-asị na unu bụ ụmụ Ebreham. Ọ bụghị ya ga-eme ka unu bụrụ ụmụ Chineke.’

Ọtụtụ ndị Juu bịakwutere Jọn ma jụọ ya, sị: ‘Olee ihe anyị ga-eme ka anyị na Chineke dịrị ná mma?’ Jọn gwara ha, sị: ‘Ọ bụrụ na unu nwere uwe ime abụọ, nyenụ onye ọ na-adịghị nke o nwere otu.’ Ị̀ ma ihe mere o ji kwuo otú ahụ? Ọ bụ na ọ chọrọ ka ndị na-eso ụzọ ya mara na ọ bụrụ na ha chọrọ ime ihe Chineke na-achọ, ha kwesịrị ịhụ ndị mmadụ n’anya.

Jọn gwara ndị ọnaụtụ, sị: ‘Na-emenụ ihe n’eziokwu, unu aghọgbukwala onye ọ bụla.’ Ọ gwakwara ndị agha, sị: ‘Unu anala aka azụ, ma ọ bụ na-agha ụgha.’

Ndị nchụàjà na ndị Livaị bịakwutekwara Jọn ma jụọ ya, sị: ‘Ị̀ bụ onye? Mmadụ niile chọrọ ịma onye ị bụ.’ Jọn gwara ha, sị: ‘Abụ m onye na-eti mkpu n’ala ịkpa. Ana m eduru ndị mmadụ ka ha bịakwute Jehova, otú ahụ Aịzaya kwuru.’

Ihe Jọn na-akụziri ndị mmadụ na-atọ ha ụtọ. Ọtụtụ ndị nọ na-eche ma ọ̀ bụ Jọn bụ Mezaya ahụ. Ma, ọ gwara ha, sị: ‘Onye ka m na-abịa. Erudịghị m eru iyipụ ya akpụkpọ ụkwụ. Eji m mmiri na-eme baptizim, ma ọ ga-eji mmụọ nsọ na-eme baptizim.’

“Nwoke a bịara ịgba àmà, ka o wee gbaa àmà banyere ìhè ahụ, ka ụdị mmadụ niile wee kwere site na ya.”​—Jọn 1:7