Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 74

Jizọs Aghọọ Mezaya

Jizọs Aghọọ Mezaya

Jọn nọ na-agwa ndị Juu, sị: ‘Onye ka m na-abịa.’ Mgbe Jizọs gbara ihe dị ka afọ iri atọ, o si na Galili gaa n’Osimiri Jọdan ebe Jọn nọ na-eme ndị mmadụ baptizim. Jizọs chọrọ ka Jọn mee ya baptizim, ma Jọn ekweghị. Jọn gwara ya, sị: ‘Ekwesịghị m ime gị baptizim. Ọ bụ gị kwesịrị ime m baptizim.’ Jizọs gwara ya, sị: ‘Jehova chọrọ ka i mee m baptizim.’ N’ihi ya, Jọn na Jizọs banyere n’Osimiri Jọdan, ya emikpuo Jizọs ná mmiri.

Mgbe Jizọs si ná mmiri ahụ pụta, o kpere ekpere. Mgbe ọ nọ na-ekpe ekpere a, eluigwe meghere, mmụọ Chineke si n’eluigwe fedata ka nduru bekwasị Jizọs n’isi. Jehova sizi n’eluigwe kwuo, sị: “Ị bụ Ọkpara m, onye m hụrụ n’anya; ihe gị masịrị m.”

Mgbe mmụọ nsọ bekwasịchara Jizọs, ọ ghọrọ Kraịst, ma ọ bụ Mezaya. Ugbu a ka ọ ga-amalite ọrụ Jehova ji maka ya zite ya n’ụwa.

Ozugbo e mechara Jizọs baptizim, ọ gara nọrọ n’ala ịkpa ruo ụbọchị iri anọ. Mgbe ọ lọghachiri, ọ gara ka ọ hụ Jọn. Ka ọ na-abịaru Jọn nso, Jọn kwuru, sị: ‘Onye a bụ Nwa Atụrụ Chineke onye ga-ewepụ mmehie nke ụwa.’ Jọn ji ihe a o kwuru mee ka ndị mmadụ mata na Jizọs bụ Mezaya ahụ. Ị̀ ma ihe mere Jizọs mgbe ahụ ọ nọ n’ala ịkpa? Anyị ga-amata n’isiokwu ọzọ.

“Otu olu wee si n’eluigwe kwuo, sị: ‘Ị bụ Ọkpara m, onye m hụrụ n’anya; ihe gị masịrị m.’”​—Mak 1:11