Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 75

Ekwensu Anwaa Jizọs Ọnwụnwa

Ekwensu Anwaa Jizọs Ọnwụnwa

Mgbe e mechara Jizọs baptizim, mmụọ nsọ duuru ya gaa n’ala ịkpa. Jizọs erighị nri ruo ụbọchị iri anọ, ezigbo agụụ malitere ịgụ ya. Ekwensu bịaziri na-anwa ya ọnwụnwa. Ọ sịrị ya: ‘Ọ bụrụ n’eziokwu na ị bụ Ọkpara Chineke, gwa nkume ndị a ka ha ghọọ achịcha.’ Ma Jizọs gwara ya ihe e dere na Baịbụl. Ọ sịrị ya: ‘E dere na ọ bụghị naanị nri ga-eme ka mmadụ dị ndụ. Ọ bụ ime ihe Jehova kwuru ga-eme ka mmadụ dị ndụ.’

Ekwensu nwara Jizọs ọnwụnwa ọzọ. Ọ sịrị ya: ‘Ọ bụrụ n’eziokwu na ị bụ Ọkpara Chineke, si n’ebe kacha elu n’ụlọ nsọ wụda. E dere na Baịbụl na Chineke ga-ezite ndị mmụọ ozi ya ka ha ghọrọ gị ka ị ghara imerụ ahụ́.’ Ma, Jizọs gwara ya ọzọ ihe e dere na Baịbụl. Ọ sịrị ya: ‘E dere na i kwesịghị ịnwa Jehova ọnwụnwa.’

Setan gosiziri Jizọs alaeze niile nke ụwa, ebube ha na akụnụba ha, ma gwa ya, sị: ‘M ga-enye gị alaeze ndị a niile na ebube ha ma i fee m ofufe naanị otu ugboro.’ Ma, Jizọs gwara ya, sị: ‘Si ebe a pụọ, Setan. E dere na ọ bụ naanị Jehova ka i kwesịrị ife ofufe.’

Ekwensu hapụziri Jizọs, ndị mmụọ ozi abịa wetara ya nri ka o rie. Si mgbe ahụ gawa, Jizọs malitere izi ndị mmadụ ozi ọma Alaeze Chineke. Ọ bụ ọrụ Chineke zitere ya n’ụwa ka ọ rụọ. Ihe Jizọs na-akụziri ndị mmadụ na-atọ ha ụtọ, ọ bụ ya mere ha ji na-eso ya aga ebe niile ọ na-aga.

“Mgbe [Ekwensu] na-ekwu okwu ụgha, ọ na-ekwu dị ka ọchịchọ ya si dị, n’ihi na ọ bụ onye ụgha, bụrụkwa nna ụgha.”​—Jọn 8:44