Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 76

Jizọs Emee Ka Ụlọ Nsọ Dị Ọcha

Jizọs Emee Ka Ụlọ Nsọ Dị Ọcha

N’ihe dị ka ọnwa Eprel nke afọ 30, Jizọs gara Jeruselem. Ọtụtụ mmadụ bịakwara Jeruselem maka Ememme Ngabiga. Ha ji anụmanụ chụọ àjà n’ụlọ nsọ n’ihi na ọ bụ otu n’ime ihe ndị a na-eme n’ememme a. Ụfọdụ ndị ji anụmanụ nke ha bịa, ndị ọzọ zụrụ nke ha na Jeruselem.

Mgbe Jizọs banyere n’ụlọ nsọ, ọ hụrụ ndị na-ere anụmanụ n’ebe ahụ. Ha nọ n’ụlọ a rụrụ maka ịnọ na-efe Jehova, na-akpa ego. Olee ihe Jizọs mere mgbe ọ hụrụ ha? O ji eriri mee ụtarị ma were ya chụpụ atụrụ na ehi niile nọ ebe ahụ. Ọ wụfukwara mkpụrụ ego nke ndị na-agbanwe ego ma kpuo tebụl ha ihu. Ọ gwara ndị na-ere nduru, sị: ‘Wepụnụ ihe ndị a n’ebe a. Unu emezila ka ụlọ Nna m bụrụ ụlọ ahịa.’

Ihe ahụ Jizọs mere juru ndị nọ n’ụlọ nsọ ahụ anya. Ndị na-eso ụzọ ya chetara amụma e buru na Baịbụl gbasara Mezaya. Ọ sịrị: ‘M ga-ekworo ụlọ Jehova ezigbo ekworo.’

Ná ngwụcha afọ 33, Jizọs mere ka ụlọ nsọ dị ọcha nke ugboro abụọ ya. Ọ chọghị ka onye ọ bụla jiri ụlọ Nna ya na-eme ihe na-ekwesịghị ekwesị.

“Unu apụghị ịbụ ndị ohu Chineke na nke Akụnụba.”​—Luk 16:13