Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 78

Jizọs Amalite Ikwusa Ozi Ọma Alaeze Chineke

Jizọs Amalite Ikwusa Ozi Ọma Alaeze Chineke

Obere oge e mechara Jizọs baptizim, ọ malitere izi ndị mmadụ ozi ọma, sị: ‘Alaeze Chineke dị nso.’ Ndị na-eso ụzọ ya sokwa ya kwusaa ozi ọma na Galili, nakwa na Judia niile. Mgbe Jizọs lọghachiri n’obodo ya bụ́ Nazaret, ọ gara n’ụlọ nzukọ, mepee akwụkwọ Aịzaya, ma gụpụtara ya ndị nọ ebe ahụ. Ọ gụrụ, sị: ‘Jehova enyela m mmụọ nsọ ka m nwee ike izi ozi ọma.’ Gịnị ka ihe a ọ gụrụ pụtara? Ihe ọ pụtara bụ na isi ihe mere Chineke ji nye Jizọs mmụọ nsọ bụ ka o kwusaa ozi ọma n’agbanyeghị na ndị mmadụ chọrọ ka Jizọs rụọ ọrụ ebube. Ọ gwaziri ndị nọ ebe ahụ, sị: ‘Taa ka e mezuru amụma a.’

Mgbe Jizọs si n’ụlọ nzukọ pụta, ọ gawara n’Osimiri Galili, bụ́ ebe ọ hụrụ mmadụ anọ mechara ghọọ ndị na-eso ụzọ ya. Ha bụ ndị na-akụ azụ̀. Ọ gwara ha, sị: ‘Soronụ m, m ga-eme unu ndị na-akụta mmadụ.’ Ha bụ Pita, Andru, Jems, na Jọn. Ozugbo ahụ, ha hapụrụ ọrụ ịkụ azụ̀ ma soro ya. Ha so ya gaa Galili niile na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke. Ha ziri ndị mmadụ ozi ọma n’ụlọ nzukọ, n’ahịa, nakwa n’okporo ámá. Ọtụtụ mmadụ na-esokwa ha ebe ọ bụla ha na-eje. Akụkọ Jizọs ruru ebe niile, ma na Siria, bụ́ obodo dị anya.

Ka oge na-aga, Jizọs nyere ụfọdụ ndị na-eso ụzọ ya ike ịgwọ ọrịa na ịchụpụ ndị mmụọ ọjọọ. Ndị ọzọ sokwa ya ka ọ na-ezi ozi ọma si n’obodo ukwu ruo n’obodo ukwu, sikwa n’obodo nta ruo n’obodo nta. E nwekwara ọtụtụ ụmụ nwaanyị na-efe Chineke nọ na-elekọta Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya. Ha bụ Meri Magdalin, Joana, Suzana, na ndị ọzọ.

Mgbe Jizọs kụzichaara ndị na-eso ụzọ ya otú e si ezi ozi ọma, o zipụrụ ha ka ha gaa zie ozi ọma. Ka ha na-ezi ozi ọma na Galili niile, ọtụtụ ndị ghọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs, e meekwa ha baptizim. E nwere ọtụtụ ndị chọrọ ịbụ ndị na-eso ụzọ Jizọs. Ọ bụ ya mere Jizọs ji were ha tụnyere ubi chara acha a ga-ewe ihe ndị a kụrụ na ya. Ọ sịrị: ‘Na-arịọnụ Jehova ka o zitekwuo ndị ọrụ ga-ewe ihe ubi ndị ahụ.’ Jizọs mechara họrọ ndị na-eso ụzọ ya iri asaa, kee ha abụọ abụọ ma zipụ ha ka ha gaa zie ozi ọma na Judia niile. Ha ziri ụdị mmadụ niile ozi ọma Alaeze Chineke. Mgbe ha lọghachiri, obi tọrọ ha ụtọ, ha akọọrọ Jizọs ihe ndị ha mere n’ozi ọma. O nweghị ihe Ekwensu nwere ike ime ga-eme ka ha kwụsị izi ozi ọma.

Jizọs gbara mbọ hụ na ndị na-eso ụzọ ya akwụsịghị ikwusa ozi ọma mgbe ọ laghachiri n’eluigwe n’ihi na ọ bụ ọrụ dị mkpa. Ọ gwara ha, sị: ‘Kwusaanụ ozi ọma n’ụwa niile. Kụzierenụ ndị mmadụ Okwu Chineke, meekwanụ ha baptizim.’

“Aghaghịkwa m izisara obodo ndị ọzọ ozi ọma alaeze Chineke, n’ihi na ọ bụ nke a mere e ji zite m.”​—Luk 4:43