Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 79

Jizọs Arụọ Ọtụtụ Ọrụ Ebube

Jizọs Arụọ Ọtụtụ Ọrụ Ebube

Jizọs bịara n’ụwa ka o kwusaa ozi ọma Alaeze Chineke. Jehova nyere ya mmụọ nsọ ka ọ rụọ ọrụ ebube iji gosi ihe ndị ọ ga-eme mgbe ọ ga-abụ Eze. Mmụọ nsọ a ga-eme ka o nwee ike ịgwọ ụdị ọrịa ọ bụla. Ebe ọ bụla ọ gara, ndị ahụ́ na-adịghị na-abịakwute ya, ya agwọọ ha niile. O mere ka ndị ìsì hụwa ụzọ, ka ndị ntị chiri, nụwa ihe, meekwa ka ndị ngwọrọ, gawa ije. Ọ chụpụkwara ndị mmụọ ọjọọ na-enye nsogbu, mmụọ ọjọọ na-enye ha nsogbu. Ọ bụrụgodị na ha emetụ ọnụ ọnụ uwe ya aka, ha na-agbake. Ndị mmadụ na-eso Jizọs ebe ọ bụla ọ na-eje. Ọ naghịdị achụpụ onye ọ bụla bịakwutere ya ma mgbe ọ chọrọ izuru ike.

Otu ụbọchị, ndị mmadụ bu otu nwoke ahụ́ ya kpọnwụrụ akpọnwụ bịa n’ụlọ ebe Jizọs nọ. Ma, ndị mmadụ juru n’ụlọ ahụ nke na o nweghị otú ha ga-esi buru ya banye. N’ihi ya, ha meghere otu ebe n’elu ụlọ ahụ, ma si ebe ahụ budatara ya Jizọs. Jizọs agwa nwoke ahụ, sị: ‘Bilie, gawa ije.’ Mgbe o biliri gawa ije, o juru ndị niile nọ ebe ahụ anya.

N’oge ọzọ Jizọs na-abanye n’otu obodo, ụmụ nwoke iri, bụ́ ndị ekpenta nọ n’ebe dị anya na-eti mkpu, sị: ‘Jizọs nyere anyị aka.’ N’oge ahụ, anaghị ekwe ka ndị ekpenta bịa nso n’ebe ndị mmadụ nọ. Jizọs gwara ha ka ha gaa n’ụlọ nsọ otú Iwu Jehova kwuru ndị ekpenta kwesịrị ime ma a gwọọ ha. Mgbe ha na-aga, ha gbakere. Mgbe otu n’ime ha chọpụtara na a gwọọla ya, ọ lọghachiri kelee Jizọs, tookwa Chineke. N’ime ndị ekpenta iri ahụ Jizọs gwọrọ, ọ bụ naanị ya bịara kelee ya.

E nwere otu nwaanyị na-arịa ọrịa kemgbe afọ iri na abụọ. Ọ chọsiri ike ka a gwọọ ya. Ọ bịara ebe Jizọs na ọtụtụ mmadụ nọ, si n’azụ Jizọs metụ ọnụ ọnụ uwe ya aka. Ozugbo o metụrụ ya aka, ọ gbakere. Mgbe ihe a mere, Jizọs jụrụ ndị mmadụ, sị: “Ònye metụrụ m aka?” Ezigbo ụjọ jidere nwaanyị ahụ, ma ọ pụtara kwuo eziokwu. Jizọs kasiri ya obi, ma gwa ya, sị: ‘Nwa m nwaanyị, laa n’udo.’

Otu onye agha aha ya bụ Jeirọs bịara rịọ Jizọs, sị: ‘Biko, bịa n’ụlọ m. Ahụ́ adịghị nwa m nwaanyị.’ Ma, tupu Jizọs erute n’ụlọ ya, nwa ya nwaanyị ahụ nwụrụ. Mgbe Jizọs rutere, ọ hụrụ ọtụtụ mmadụ nọ ebe ahụ na-ebe ákwá. Jizọs gwara ha, sị: ‘Kwụsịnụ ibe ákwá, ọ na-ehi ụra.’ O seere nwa ahụ n’aka ma kwuo, sị: “Nwata nwaanyị bilie.” O biliri ozugbo. Jizọs gwara mama ya na papa ya ka ha nye ya nri ka o rie. Chegodị otú obi dị mama ya na papa ya mgbe ahụ.

‘Chineke ji mmụọ nsọ na ike tee ya mmanụ, o wee gazuo ala ahụ na-eme ihe ọma ma na-agwọ ndị niile Ekwensu na-emekpọ ọnụ; n’ihi na Chineke nọnyeere ya.’​—Ọrụ Ndịozi 10:38