Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 81

Ihe Jizọs nọ n’Elu Ugwu Kụzie

Ihe Jizọs nọ n’Elu Ugwu Kụzie

Mgbe Jizọs họrọchaara ndịozi iri na abụọ ya, o si n’elu ugwu gbadata ma gaa n’ebe ọtụtụ mmadụ gbakọrọ n’akụkụ ugwu ahụ. Ụfọdụ n’ime ndị a si Galili, Judia, Taya, Saịdọn, Siria, nakwa n’akụkụ nke ọzọ nke Jọdan bịa ebe ahụ. Ha kpọtaara ya ndị na-arịa ọrịa na ụfọdụ ndị mmụọ ọjọọ na-enye nsogbu. Jizọs gwọrọ ha niile. Mgbe ọ gwọchara ha, ọ nọdụrụ ala n’akụkụ ugwu ma malite ịkụziri ha ihe. O kwuru ihe anyị ga-eme ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ka anyị na Chineke bụrụ enyi. Anyị kwesịrị ịmata Jehova nke ọma ma na-ahụ ya n’anya. Ma anyị enweghị ike ịhụ Chineke n’anya ma ọ bụrụ na anyị ahụghị ndị ọzọ n’anya. Anyị kwesịrị ịhụ mmadụ niile n’anya, ma ndị iro anyị. Anyị kwesịkwara ịna-emere ha ihe ọma.

Jizọs kwuru, sị: ‘Ọ bụghị ndị enyi unu naanị ka unu kwesịrị ịhụ n’anya. Unu kwesịkwara ịhụ ndị iro unu n’anya, ma jiri obi unu na-agbaghara ndị mere unu ihe ọjọọ. Ọ bụrụ na i mee ihe were mmadụ iwe, gaa ozugbo rịọ ya ka ọ gbaghara gị. Na-emeso ndị ọzọ ihe otú ị chọrọ ka ha si na-emeso gị.’

Jizọs gwara ha otú ha kwesịrị isi na-ele ego anya. O kwuru, sị: ‘Ọ ka mma ịbụ enyi Jehova karịa inwe nnukwu ego. Onye ohi nwere ike izu ego unu, ma o nweghị onye nwere ike ime ka unu na Jehova kwụsị ịbụ enyi. Kwụsịnụ ichegbu onwe unu maka ihe unu ga-eri, ma ọ bụ ihe unu ga-aṅụ, ma ọ bụ maka uwe unu ga-eyi. Legodịnụ ụmụ nnụnụ, Chineke na-enye ha nri ga-ezuru ha mgbe niile. Ichegbu onwe unu agaghị eme ka ndụ unu dịkwuo ogologo. Chetanụ na Jehova ma ihe ndị dị unu mkpa.’

Ndị ahụ ọ nọ na-ezi ihe ahụtụbeghị onye na-akụzi ihe ka Jizọs. Ndị ndú okpukpe ha akụzitụbereghị ha ihe ndị a. Gịnị mere Jizọs ji bụrụ ezigbo onye ozizi? Ọ bụ n’ihi na ihe niile ọ kụziiri ndị mmadụ si n’aka Jehova.

“Nyaranụ yok m, mụtakwanụ ihe n’aka m, n’ihi na m dị nwayọọ, dịkwa umeala n’obi, mkpụrụ obi unu ga-enweta ume.”​—⁠Matiu 11:29