Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 82

Jizọs Akụziere Ndị Na-eso Ụzọ Ya Otú E Si Ekpe Ekpere

Jizọs Akụziere Ndị Na-eso Ụzọ Ya Otú E Si Ekpe Ekpere

Ndị Farisii na-eme ihe niile ha na-eme ka ndị mmadụ na-aja ha mma. Ọ bụrụ na ha emeere mmadụ ihe ọma, ọ bụ ka ndị ọzọ hụ ha. Ha chọọ ikpe ekpere, ha na-aga n’ebe ọhaneze na-anọ, na-ekpe ya ka mmadụ niile hụ ha. Ndị Farisii na-ebu ogologo ekpere n’isi ma nọrọ n’ụlọ nzukọ ma ọ bụ n’okporo ámá na-ekwughachi ya ka ndị mmadụ nụ ihe ha na-ekwu. N’ihi ya, o juru ndị mmadụ anya mgbe Jizọs gwara ha, sị: ‘Unu ekpela ekpere ka ndị Farisii. Ha chere na Chineke ga-anụ olu ha n’ihi ọtụtụ okwu ha na-ekwu mgbe ha na-ekpe ekpere. Ma, ọ naghị anụ olu ha. Ekpere bụ okwu ị na-agwa naanị Jehova. Ekwughachila otu ihe ugboro ugboro mgbe ị na-ekpe ekpere. Jehova chọrọ ka ị gwa ya otú obi dị gị.

‘Otú a ka unu kwesịrị isi na-ekpe ekpere: “Nna anyị nke bi n’eluigwe, ka e doo aha gị nsọ. Ka Alaeze gị bịa. Ka uche gị meekwa n’ụwa, dị ka ọ na-eme n’eluigwe.”’ Jizọs gwakwara ha ka ha na-arịọ Chineke ka o nye ha nri ha ga-eri n’ụbọchị, nakwa ka ọ gbaghara ha mmehie ha. Ọ gwara ha ka ha na-arịọ Chineke ka o meekwara ha ihe ndị ọzọ dị ha mkpa.

Jizọs kwuru, sị: ‘Na-ekpenụ ekpere mgbe niile. Na-arịọnụ Nna unu bụ́ Jehova, ka o meere unu ihe ọma. Nne ma ọ bụ nna ọ bụla na-achọ imere nwa ya ihe ọma. Ọ bụrụ na nwa gị arịọ gị achịcha, ị̀ ga-enye ya okwute? Ọ bụrụkwa na ọ rịọ gị azụ̀, ị̀ ga-enye ya agwọ?’

Jizọs kwuziri ihe ọ chọrọ ka ndị ọ na-akụziri ihe mụta. Ọ sịrị: ‘Ọ bụrụ na unu maara otú e si enye ụmụ unu ezi onyinye, ọ̀ bụ na Nna unu bụ́ Jehova agaghị enye unu mmụọ nsọ ya karịa? N’ihi ya, na-arịọnụ ya ihe ọ bụla unu chọrọ ịrịọ ya.’ Ị̀ na-eme ihe a Jizọs kwuru? Olee ihe ndị ị na-ekpe n’ekpere?

“Na-arịọnụ, a ga-enye unu; na-achọnụ, unu ga-achọta; na-akụnụ, a ga-emeghere unu.”​—Matiu 7:7