Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 84

Jizọs Agaa Ije n’Elu Mmiri

Jizọs Agaa Ije n’Elu Mmiri

Jizọs nwere ikike ịgwọ ndị ọrịa na ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ. O nwekwara ikike ime ka oké ifufe na ebili mmiri kwụsị. Mgbe Jizọs kpechara ekpere n’elu ugwu, ọ nọ ebe ahụ hụ oké ifufe na-efe n’Oké Osimiri Galili. Ndịozi ya nọkwa n’ụgbọ ha n’Oké Osimiri ahụ. Oké ifufe ahụ mere ka o siere ha ike ịkwọ ụgbọ ha n’ihi na ọ na-efesi ike. Jizọs si n’elu ugwu ahụ gbadata, ma malite ịga ije n’elu mmiri na-agakwuru ndịozi ya n’ụgbọ ha. Mgbe ndịozi ya hụrụ onye na-aga ije n’elu mmiri, ụjọ tụwara ha. Ma, Jizọs gwara ha, sị: ‘Unu atụla ụjọ. Ọ bụ m.’

Pita gwara Jizọs, sị: ‘Onyenwe anyị, ọ bụrụ na ọ bụ gị, gwa m ka m bịakwute gị.’ Jizọs gwara ya, sị: ‘Bịawa.’ N’ihi ya, Pita si n’ụgbọ ahụ pụta gawa ije n’elu mmiri na-abịakwute Jizọs n’agbanyeghị oké ifufe ahụ. Ka Pita na-abịaru Jizọs nso, o lewere oké ifufe ahụ anya, tụwa ụjọ ma malite imikpu. Pita tiri mkpu, sị: ‘Onyenwe anyị, zọpụta m.’ Jizọs matịrị aka jide ya, ma sị ya: ‘Gịnị mere i ji nwewe obi abụọ? Olee ebe okwukwe gị dị?’

Mgbe Jizọs na Pita banyere n’ụgbọ ahụ, oké ifufe ahụ kwụsịrị ozugbo. Olee otú i chere obi ga-adị ndịozi Jizọs mgbe ahụ? Ha gwara Jizọs, sị: ‘Ị bụ Ọkpara Chineke n’eziokwu.’

Nke a abụghị nke mbụ Jizọs mere ụdị ihe a. O nwekwara oge ọzọ Jizọs na ndịozi ya ji ụgbọ mmiri na-agafe n’akụkụ ọzọ nke Osimiri Galili, Jizọs agaa n’azụ ụgbọ ahụ na-ehi ụra. Ka ọ na-ehi ụra, oké ifufe malitere ife n’oké osimiri ahụ. Ebili mmiri nọkwa na-akụ n’ụgbọ ha, ya emee mmiri eju n’ụgbọ ahụ. Ndịozi Jizọs kpọtere ya, ma gwa ya, sị: ‘Onye ozizi, anyị na-agadị ịnwụ. Nyere anyị aka.’ Jizọs biliri ma gwa osimiri ahụ, sị: “Daa jụụ.” Ozugbo ahụ, ifufe ahụ na osimiri ahụ dara jụụ. Jizọs jụrụ ndịozi ya, sị: ‘Olee ebe okwukwe unu dị?’ Ha gwawara ibe ha, sị: ‘Ma ifufe ma oké osimiri na-erubechara ya isi.’ Ihe a kụziiri ndịozi Jizọs na ha ekwesịghị ịtụ ụjọ ihe ọ bụla ma ọ bụrụ na ha atụkwasị Jizọs obi ha niile.

“Gịnị ka m gaara eme ma a sị nnọọ na enweghị m okwukwe n’ịhụ ịdị mma Jehova n’ala ndị dị ndụ?”​—Abụ Ọma 27:13