Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 86

Jizọs Akpọlite Lazarọs n’Ọnwụ

Jizọs Akpọlite Lazarọs n’Ọnwụ

Jizọs nwere ndị enyi atọ bi na Betani. Aha ha bụ Lazarọs, Meri na Mata. Ha atọ bụ ụmụnne, bụrụkwa ezigbo ndị enyi Jizọs. Otu ụbọchị, mgbe Jizọs nọ n’akụkụ nke ọzọ nke Jọdan, Meri na Mata ziteere ya ozi na-achọ ka ọ bịa ozugbo. Ha sịrị ya: ‘Ahụ́ adịghị Lazarọs. Biko, bịa ngwa ngwa.’ Ma, Jizọs agaghị ozugbo ahụ. Tupu ya agaa, Lazarọs nwụrụ. Mgbe abalị abụọ gara e zichara ya ozi, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: ‘Ka anyị gaa Betani. Lazarọs na-ehi ụra, m na-eje ebe ahụ ka m kpọtee ya.’ Ndịozi ya gwara ya, sị: ‘Ọ bụrụ na ọ na-ehi ụra, ọ ga-enyere ya aka ịgbake.’ Ma, Jizọs gwara ha hoo haa, sị: ‘Lazarọs anwụọla.’

Mgbe Jizọs rutere Betani, e liela Lazarọs kemgbe abalị anọ. Ọtụtụ mmadụ bịara ebe ahụ ka ha kasie Mata na Meri obi. Mgbe Mata nụrụ na Jizọs erutela, ọ gbaara gawa ka ọ hụ ya. Ọ gwara Jizọs, sị: “Onyenwe anyị, a sị na ị nọ n’ebe a, nwanne m nwoke agaraghị anwụ.” Jizọs gwara ya, sị: ‘Nwanne gị nwoke ga-adị ndụ ọzọ. Ì kwere nke a, Mata?’ Ọ gwara Jizọs, sị: ‘Ekwere m na ọ ga-ebili n’oge a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ.’ Jizọs gwara ya, sị: “Abụ m mbilite n’ọnwụ na ndụ.”

Mata hapụziri Jizọs ma gaa gwa Meri, sị: ‘Jizọs abịala.’ Meri gbaara ọsọ gaa ka ọ hụ Jizọs, ọtụtụ ndị nọ ebe ahụ sokwa ya gaa. Mgbe ọ hụrụ Jizọs, ọ dara n’ala n’ụkwụ ya, na-ebe ákwá. Ọ gwara ya, sị: ‘Onyenwe anyị, a sị na ị nọ n’ebe a, nwanne anyị nwoke agaraghị anwụ.’ Jizọs hụrụ otú o si na-ebe ákwá, ya esoro ya bewe ákwá. Mgbe ìgwè mmadụ ahụ hụrụ anya mmiri na-agba Jizọs, ha sịrị: ‘Ọ hụrụ Lazarọs n’anya nke ukwuu.’ Ma, ụfọdụ sịrị: ‘Gịnị mere o meghị ka enyi ya ghara ịnwụ?’ Olee ihe Jizọs ga-eme ugbu a?

Jizọs gara ebe e liri Lazarọs. E jikwa nnukwu nkume dọchie ọnụ ya. Ọ gwara ndị nọ ebe ahụ, sị: ‘Kwapụnụ nkume ahụ.’ Mata gwara ya, sị: ‘Ma ihe a bụ abalị anọ ọ nwụrụ. O siwela ísì ugbu a.’ N’agbanyeghị ihe a Mata kwuru, ha kwapụrụ nkume ahụ. Mgbe ha kwapụchara ya, Jizọs ekpee ekpere, sị: ‘Nna, ana m ekele gị maka na ị na-anụ olu m. Ama m na ị na-anụ olu m mgbe niile; ma ana m ekwu ihe a ka ìgwè mmadụ a nụ ya ma mata na ọ bụ gị zitere m.’ Mgbe o kpechara ekpere a, o ji oké olu kpọọ Lazarọs, sị: “Lazarọs, pụta!” Ihe dị egwu meziri. Lazarọs si n’ili ahụ pụta. O bukwa ákwà e kere ya pụta. Jizọs kwuru, sị: “Tọpụnụ ya ákwà ma hapụ ya ka ọ laa.”

Ọtụtụ ndị hụrụ ihe a kweere na Jizọs. Ma, ụfọdụ gara gwa ndị Farisii ihe merenụ. Si mgbe ahụ gawa, ha chọwara otú ha ga-esi egbu ma Jizọs ma Lazarọs. Otu n’ime ndịozi iri na abụọ Jizọs aha ya bụ Judas Iskarịọt gakwuuru ndị Farisii na nzuzo ma jụọ ha, sị: ‘Ego ole ka unu ga-akwụ m ma m nyere unu aka jide ya?’ Ha kwekọrịta inye ya mkpụrụ ego ọlaọcha iri atọ. Si mgbe ahụ gawa, Judas nọ na-achọ ohere ọ ga-eji mee ka ha jide Jizọs.

“Ezi Chineke bụụrụ anyị Chineke nke na-enye nzọpụta; ọ bụkwa n’aka Jehova bụ́ Ọkaakaa Onyenwe anyị ka ụzọ e si alanahụ ọnwụ dị.”​—Abụ Ọma 68:20