Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 87

Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị

Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị

Ndị Juu na-eme Ememme Ngabiga kwa afọ n’abalị iri na anọ n’ọnwa Naịsan. Ememme a na-echetara ha otú Jehova si kpọpụta ha n’Ijipt ebe ha nọ na-agba ohu ma kpọga ha n’Ala Nkwa ahụ. N’afọ 33, Jizọs na ndịozi ya nọ n’ọnụ ụlọ dị n’elu na Jeruselem mee Ememme Ngabiga. Mgbe ha richara nri, Jizọs sịrị ha: ‘Otu n’ime unu ga-enyefe m n’aka ndị Juu.’ Ihe a o kwuru wutere ndịozi ya, ha ajụọ ya, sị: ‘Ònye ka ọ bụ?’ Jizọs sịrị ha: ‘Ọ bụ onye m ga-enye achịcha a m ji.’ Mgbe o kwuchara ihe a, ya enye ya Judas Iskarịọt. Ozugbo o nyere ya Judas, Judas ebilie pụọ.

Mgbe ọ pụrụ, Jizọs kpere ekpere, nyawaa achịcha ma nye ya ndịozi ya ndị ọzọ. Ọ gwara ha, sị: ‘Taanụ achịcha a. Ọ na-anọchi anya ahụ́ m, bụ́ nke m ga-enye n’ihi unu.’ O wepụtakwara mmanya, kpee ekpere ma nye ya ndịozi ya. Ọ sịrị ha: ‘Ṅụọnụ mmanya a. Ọ na-anọchi anya ọbara m, bụ́ nke m ga-awụsa ka e nwee ike ịgbaghara ndị mmadụ mmehie ha. M na-ekwe unu nkwa na mụ na unu ga-abụ eze n’eluigwe. Na-emenụ nke a kwa afọ ka unu na-echeta m.’ N’afọ ọ bụla, ndị na-eso ụzọ Jizọs ka na-ezukọ ná mgbede nke abalị iri na anọ n’ọnwa Naịsan na-eme ihe a Jizọs gwara ha. Ihe a na-akpọzi ya bụ Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị.

Mgbe ha richara nri anyasị a, ndịozi ya malitere ise okwu banyere onye kacha ukwuu n’ime ha. Ma, Jizọs sịrị ha: ‘Onye kacha ukwuu n’ime unu bụ onye weere onwe ya ka onye kacha ntakịrị n’ime unu ma ọ bụ onye weere onwe ya na ndị ọzọ ka ya mkpa.

‘Unu bụ ndị enyi m. M gwara unu ihe niile Nna m chọrọ ka m gwa unu. N’oge na-adịghị anya, m ga-alakwuru Nna m n’eluigwe. Unu agaghị eso m aga ugbu a. Ma, ndị mmadụ ga-amata na unu bụ ndị na-eso ụzọ m n’ihi otú unu si hụ ibe unu n’anya. Unu ga-ahụ ibe unu n’anya otú ahụ m si hụ unu n’anya.’

Mgbe Jizọs gwachara ndịozi ya ihe ndị a, o kpere ekpere ma rịọ Jehova ka o chebe ndị na-eso ụzọ ya niile. Ọ rịọkwara Jehova ka o nyere ha aka ka ha dịrị n’udo ma jiri otu obi na-arụ ọrụ. O kpekwara ekpere ka e doo aha Jehova nsọ. Mgbe o kpechara ekpere a, ya na ndịozi ya bụrụ abụ ha ji too Jehova ma pụọ n’èzí. N’oge na-adịghị anya, a ga-abịa jide Jizọs.

“Unu atụla egwu, ìgwè atụrụ nta, n’ihi na ọ dị Nna unu mma inye unu alaeze.”​—Luk 12:32