Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 88

E Jidere Jizọs

E Jidere Jizọs

Jizọs na ndịozi ya si na Ndagwurugwu Kidrọn gaa Ugwu Oliv. Ha rutere ebe ahụ n’ime abalị, ezigbo ọnwa nọkwa na-agba. Mgbe ha rutere n’ogige Getsemeni, Jizọs gwara ndịozi ya, sị: “Nọrọnụ n’ebe a na-eche nche.” Jizọs hapụziri ha gatụ n’ihu n’ogige ahụ ma gbuo ikpere n’ala. Ma, obi erughị ya ala, ya ekpee ekpere ma rịọ Jehova, sị: “Ka uche gị mee.” Jehova zigara mmụọ ozi ya ka ọ gbaa ya ume. Mgbe Jizọs gaghachiri ebe ndịozi ya nọ, ọ hụrụ ha ka ha na-ehi ụra. Ọ gwara ha, sị: ‘Bilienụ. Ugbu a abụghị oge unu kwesịrị iji na-ehi ụra. Oge eruola ka e nyefee m n’aka ndị iro m.’

Obere oge, Judas akpọrọ ìgwè mmadụ ji mma agha na osisi bịa n’ogige ahụ Jizọs na ndịozi ya nọ. Ọ ma ebe ọ ga-achọta Jizọs n’ihi na ha na-abịakarị n’ogige a. Judas gwara ndị agha so ìgwè mmadụ ahụ na ya ga-eme ihe ha ga-eji mata onye Jizọs bụ. Ozugbo ọ hụrụ Jizọs, ya agakwuru ya, ma sị ya: ‘Onye Ozizi, ndeewo,’ ma susuo ya ọnụ. Jizọs gwara ya sị: ‘Ì ji isusu m ọnụ enyefe m n’aka ha?’

Jizọs gakwuuru ìgwè mmadụ ahụ ma jụọ ha, sị: “Ònye ka unu na-achọ?” Ha asị ya: “Jizọs onye Nazaret.” Jizọs agwa ha, sị: “Ọ bụ m.” Mgbe o kwuru ihe a, ha lara azụ, ma daa n’ala. Jizọs jụkwara ha ọzọ, sị: “Ònye ka unu na-achọ?” Ha gwara ya ọzọ, sị: “Jizọs onye Nazaret.” Jizọs gwara ha, sị: ‘Agwara m unu na ọ bụ m. Hapụnụ ndị a ka ha laa.’

Mgbe Pita hụrụ ihe na-emenụ, ya amịrị mma agha bepụ Malkọs ntị. Malkọs bụ ohu nnukwu onye nchụàjà. Ma Jizọs bitụrụ ntị ahụ aka ma gwọọ ohu ahụ. Ọ gwaziri Pita: ‘Mịghachi mma gị n’ọbọ. Ndị na-eji mma agha alụ agha, ga-anwụ na mma agha.’ Ndị agha ahụ jidere Jizọs kee ya agbụ n’aka, ndịozi Jizọs agbaa ọsọ. Ha akpọrọzie Jizọs gakwuru Anas, bụ́ onyeisi nchụàjà. Anas jụrụ Jizọs ọtụtụ ajụjụ ma ziga ya n’ụlọ Nnukwu Onye Nchụàjà aha ya bụ Keyafas. Ma, gịnị meziri ndịozi Jizọs?

“N’ụwa, unu na-enwe mkpagbu, ma nweenụ obi ike! Emeriwo m ụwa.”​—Jọn 16:33