Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 89

Pita Ekwuo na Ya Amaghị Jizọs

Pita Ekwuo na Ya Amaghị Jizọs

Mgbe Jizọs na ndịozi ya nọ n’ọnụ ụlọ dị n’elu, ọ gwara ha, sị: ‘Unu niile ga-ahapụ m gbaa ọsọ.’ Ma, Pita gwara ya, sị: ‘Agaghị m ahapụ gị. Ọ bụrụgodị na ndị ọzọ niile ahapụ gị, agaghị m ahapụ gị.’ Jizọs gwara ya, sị: ‘Tupu oké ọkpa akwaa, ị ga-ekwu ugboro atọ na ị maghị onye m bụ.’

Mgbe ndị agha kpọọrọ Jizọs gawa n’ụlọ Keyafas, ọtụtụ n’ime ndịozi ya gbara ọsọ. Ma, ndịozi Jizọs abụọ sooro ìgwè mmadụ ahụ. Otu n’ime ha bụ Pita. Ọ gara nọrọ n’ogige ụlọ Keyafas, ma soro ndị nọ ebe ahụ na-anya ọkụ. Otu nwa agbọghọ na-eje ozi lere ya anya n’ihu ma gwa ya, sị: ‘Ama m gị. Gị na Jizọs na-eso.’

Pita gwara ya, sị: ‘Mba, mụ na ya anaghị eso. Amaghị m ihe ị na-ekwu.’ Pita si ebe ahụ pụọ gawa n’ọnụ ụzọ ogige ahụ. Obere oge, nwa agbọghọ ọzọ na-eje ozi hụrụ ya ma gwa ndị nọ ebe ahụ, sị: ‘Nwoke a na Jizọs na-eso.’ Pita agwa ha, sị: ‘Amaghịdị m onye Jizọs bụ.’ Otu nwoke nọ ebe ahụ sịrị Pita: ‘Ị bụ otu n’ime ha. Otú i si ekwu okwu na-egosi na ị bụ onye Galili ka Jizọs.’ Ma Pita ṅụrụ iyi, sị: ‘Amaghị m onye ọ bụ.’

Ozugbo Pita kwuchara ihe a, oké ọkpa kwara. Ọ hụrụ ka Jizọs tụgharịrị ma lee ya anya, ya echeta ihe Jizọs gwara ya, pụọ n’èzí, ma bee ezigbo ákwá.

Ma, ndị Sanhedrin zukọtara n’ụlọ Keyafas ka ha kpee Jizọs ikpe. Ha ekpebiela igbu ya, ma ha na-achọ ihe ha ga-asị na o mere. Ha achọtaghị ihe ọ bụla. Keyafas mechara jụọ Jizọs, sị: ‘Ị̀ bụ Ọkpara Chineke?’ Jizọs sịrị ya: ‘Abụ m.’ Keyafas ekwuo, sị: ‘Ọ dịghị mkpa ịchọ ndị akaebe ọzọ. O kwuluola Chineke.’ Ha niile mara ya ikpe ma kwuo, sị: ‘O kwesịrị ọnwụ.’ Ha gbara ya aka ntị, bụọ ya ọnụ mmiri, kpuchie ya ihu, ma kụọ ya ihe. Ha sịrị ya: ‘Ọ bụrụ na ị bụ onye amụma, gwa anyị onye kụrụ gị ihe.’

Mgbe chi bọrọ, ha kpọọrọ Jizọs gaa n’ụlọ nzukọ Sanhedrin. Ha jụrụ ya, sị: ‘Ị̀ bụ Ọkpara Chineke?’ Jizọs zara ha, sị: ‘Unu na-ekwu na m bụ.’ Ha kwuziri na Jizọs kwuluru Chineke ma maa ya ikpe ọnwụ. Ha kpọọrọ ya gaa n’ụlọ gọvanọ Rom aha ya bụ Pọntiọs Paịlet. Olee ihe mere mgbe ha gara ebe ahụ? Ka anyị chọpụta.

‘Oge awa . . . abịawo, mgbe a ga-achụsasị unu, onye ọ bụla alaa n’ụlọ ya, unu ga-ahapụkwa naanị m; ma anọghị m naanị m, n’ihi na Nna m nọnyeere m.’​—Jọn 16:32