Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 90

Jizọs Anwụọ na Gọlgọta

Jizọs Anwụọ na Gọlgọta

Ndị isi nchụàjà kpọọrọ Jizọs gaa n’ụlọ Paịlet. Paịlet ajụọ ha, sị: ‘Olee ihe ọjọọ nwoke a mere?’ Ha sịrị ya: ‘Ọ sịrị na ya bụ eze.’ Paịlet jụrụ Jizọs, sị: “Ị̀ bụ Eze ndị Juu?” Jizọs agwa ya, sị: “Alaeze m abụghị nke ụwa a.”

Paịlet zigaara ya Herọd ka ọ mara ma ò ga-achọpụta ihe Jizọs mere. Ọ bụ Herọd na-achị Galili. E nweghị ihe ọjọọ Herọd chọpụtara Jizọs mere, ya ezighachiri ya Paịlet. Paịlet gwaziri ìgwè mmadụ nọ ebe ahụ, sị: ‘Ma mụ ma Herọd enweghị ihe ọjọọ anyị hụrụ nwoke a mere. M ga-ahapụ ya.’ Ha tiri mkpu, sị: ‘Kpọgbuo ya! kpọgbuo ya!’ Ndị agha pịara ya ụtarị, gbụọ ya ọnụ mmiri, ma kụọ ya ihe. Ha kpuwere ya okpu e ji ogwu kpaa, jiri ya na-eme ihe ọchị, sị: ‘Ndeewo, Eze ndị Juu.’ Paịlet gwara ìgwè mmadụ ahụ ọzọ, sị: ‘O nweghị ihe ọjọọ m hụrụ nwoke a mere.’ Ma, ha tiri mkpu, sị: “Kpọgide ya n’osisi!” Paịlet kpọnyere ha Jizọs ka ha kpọgide ya n’osisi.

Ha kpọọrọ Jizọs gaa n’ebe a na-akpọ Gọlgọta, kpọgide ya n’osisi ma bulie osisi ahụ elu. Jizọs kpere ekpere, sị: ‘Nna, gbaghara ha, n’ihi na ha amaghị ihe ha na-eme.’ Ndị mmadụ ji ya mewe ihe ọchị, ma gwa ya, sị: ‘Ọ bụrụ na ị bụ Ọkpara Chineke, si n’osisi ịta ahụhụ a rịdata, ma zọpụta onwe gị.’

Otu n’ime ndị omekome a kpọgidere ha na Jizọs n’osisi gwara ya, sị: “Cheta m mgbe ị banyere n’alaeze gị.” Jizọs gwara ya, sị: “Mụ na gị ga-anọ na Paradaịs.” N’ehihie ụbọchị ahụ, ọchịchịrị gbara ebe niile ruo awa atọ. Ụfọdụ ndị na-eso ụzọ ya guzo nso n’ebe ahụ a kpọgburu ya, ma Meri nne ya. Jizọs gwara Jọn ka o lekọta Meri ka nne ya.

N’ikpeazụ, Jizọs kwuru, sị: ‘Emechaala ya.’ Mgbe o kwuchara ihe a, ya ehulata isi ma kubie ume. Oké ala ọma jijiji malitere ime ozugbo. N’ụlọ nsọ, ákwà mgbochi nke kewara Ebe Nsọ na Ebe Kasị Nsọ dọwara abụọ malite n’elu ruo n’ala. Mgbe ihe ndị a na-eme, onyeisi ndị agha kwuru, sị: ‘N’eziokwu, nwoke a bụ Ọkpara Chineke.’

‘N’agbanyeghị ole nkwa Chineke dị, ha abụrụla ee site na ya.’ —2 Ndị Kọrịnt 1:20