Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 91

A Kpọlitere Jizọs n’Ọnwụ

A Kpọlitere Jizọs n’Ọnwụ

Mgbe Jizọs nwụrụ, otu nwoke bara ọgaranya aha ya bụ Josef gara rịọ Paịlet ka ya gaa buru ozu ya lie, ya ekweta. Josef buuru ozu ya, jiri ákwà linin mara mma fụchie ya, tee ya ihe ndị na-esi ìsì ọma, ma lie ya n’ili ọhụrụ. Ọ kwaara nnukwu nkume kwachie ọnụ ya. Ndị isi nchụàjà gara gwa Paịlet, sị: ‘Ọ na-adị anyị ka ụfọdụ ndị na-eso ụzọ ya nwere ike ịga buru ozu ya ma kwuo na a kpọlitela ya n’ọnwụ.’ N’ihi ya, Paịlet gwara ha, sị: ‘Mechisienụ ili ahụ ike, debekwanụ ndị nche na ya.’

Mgbe abalị atọ gachara, n’isi ụtụtụ, ụfọdụ ụmụ nwaanyị gara n’ili ahụ ma chọpụta na a kwapụla nkume ahụ e ji kwachie ọnụ ya. Ha hụrụ otu mmụọ ozi n’ili ahụ, ya agwa ha, sị: ‘Unu atụla ụjọ. A kpọlitela Jizọs n’ọnwụ. Gaanụ gwa ndị na-eso ụzọ ya ka ha gaa na Galili hụ ya.’

Meri Magdalin gbaara ọsọ gaa chọọ Pita na Jọn. Mgbe ọ hụrụ ha, ọ gwara ha, sị: ‘E bupụla ozu Jizọs.’ Pita na Jọn gbaara ọsọ gaa n’ili ahụ. Mgbe ha rutere, ha hụrụ na o nweghị ihe dị na ya, ha alaghachi n’ụlọ ha.

Mgbe Meri lọghachiri n’ili ahụ, ọ hụrụ ndị mmụọ ozi abụọ, ya agwa ha, sị: ‘Amaghị m ebe ha debere Onyenwe m.’ Ọ hụziri otu nwoke nọ ebe ahụ, ya echee na ọ bụ onye nche. Ọ sịrị ya, ‘Nna m ukwu, gwa m ebe ị dowere ya.’ Ma, mgbe nwoke ahụ kpọrọ ya “Meri,” ọ matara na ọ bụ Jizọs. Meri tiri mkpu, kpọọ ya, “Onye Ozizi!” ma makụọ ya. Jizọs gwara ya, sị: ‘Gaa gwa ụmụnna m na ị hụrụ m.’ Ozugbo ahụ, Meri gbaara ọsọ gaa hụ ndị na-eso ụzọ Jizọs ma gwa ha na ya ahụla Jizọs.

Ná mgbede ụbọchị ahụ, ndị na-eso ụzọ Jizọs abụọ si Jeruselem na-aga Emeọs ma na-akparịta ụka ka ha na-aga. Otu nwoke bịakwutere ha ma soro ha. Ọ jụrụ ha ihe ha nọ na-ekwu. Ha agwa ya, sị: ‘Ọ̀ bụ na ị nụbeghị ihe na-emenụ? Abalị atọ gara aga, ndị isi nchụàjà gburu Jizọs. Ugbu a, ụfọdụ ụmụ nwaanyị na-ekwu na ọ dị ndụ.’ Nwoke ahụ ajụọ ha, sị: ‘Ọ̀ bụ na unu ekweghị ihe ndị amụma kwuru? Ha kwuru na Kraịst ga-anwụ, na a ga-akpọlitekwa ya n’ọnwụ.’ Ọ nọgidere na-akọwara ha ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ. Mgbe ha ruru Emeọs, ndị na-eso ụzọ Jizọs abụọ ahụ gwara nwoke ahụ ka o soro ha laa n’ụlọ ha, ya ekweta. Mgbe ha chọrọ iri nri anyasị, nwoke ahụ weere achịcha, kpee ekpere. Ka ha na-eri nri, ha matara na ọ bụ Jizọs. Mgbe ha matara, ya apụọ n’anya ha.

Ndị na-eso ụzọ abụọ ahụ laghachiri Jeruselem ozugbo. Ha gara n’ụlọ ebe ndịozi Jizọs zukọrọ ma gwa ha ihe merenụ. Mgbe ha ka nọ n’ụlọ ahụ, Jizọs pụtara n’ihu ha. Ha ekwetaghị na ọ bụ ya ná mmalite. Ọ gwaziri ha, sị: ‘Leenụ aka m, metụnụ m aka. E dere n’Akwụkwọ Nsọ na Kraịst ga-esi n’ọnwụ bilie.’

“Ọ bụ m bụ ụzọ na eziokwu na ndụ. Ọ dịghị onye na-abịakwute Nna m ma ọ́ bụghị site na mụ.”—Jọn 14:6