Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 93

Jizọs Alaghachi Eluigwe

Jizọs Alaghachi Eluigwe

Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya na ya na ha ga-ezukọ na Galili. Mgbe ha zukọrọ, o nyere ha otu iwu dị ezigbo mkpa. Ọ sịrị ha: ‘Gaanụ mee ndị mba niile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m. Na-akụziri ha ihe niile m kụziiri unu, na-emekwa ha baptizim.’ Ọ gwakwara ha, sị: ‘Maranụ na m nọnyeere unu mgbe niile.’

N’ime abalị iri anọ ahụ Jizọs nọrọ n’ụwa mgbe a kpọlitechara ya n’ọnwụ, ọ pụtara n’ihu ọtụtụ narị ndị na-eso ụzọ ya ma na Galili ma na Jeruselem. Ọ kụziiri ha ọtụtụ ihe dị mkpa, rụọkwa ọtụtụ ọrụ ebube. Jizọs na ndịozi ya mechara zukọọ nke ikpeazụ ya n’Ugwu Oliv. Ka ha nọ ebe ahụ, ọ gwara ha, sị: ‘Unu esila na Jeruselem pụọ. Nọrọnụ ebe ahụ chere ihe Nna m kwere ná nkwa.’

Ndịozi ya aghọtaghị ihe ahụ o kwuru. Ha ajụọ ya, sị: ‘Ọ̀ bụ ugbu a ka ị ga-abụ Eze Izrel?’ Jizọs zara ha, sị: ‘Oge Jehova ga-eme m Eze erubeghị. N’oge na-adịghị anya, unu ga-enweta ike mgbe a ga-enye unu mmụọ nsọ. Unu ga-abụkwa ndị àmà m. Gaanụ kwusaa ozi ọma na Jeruselem, Judia, na Sameria, ruokwa ebe ndị kacha anya n’ụwa.’

Mgbe o kwuchara ihe ndị a, e buliri ya elu, ígwé ojii kpuchikwara ya. Ndị na-eso ụzọ ya nọ na-ele anya n’elu, ma ha ahụghịzi ya n’ihi na ọ laghachila eluigwe.

Ndị na-eso ụzọ ya si n’Ugwu Oliv ahụ laghachi Jeruselem. Ha na-ezukọ mgbe niile n’otu ọnụ ụlọ dị n’elu ma na-ekpe ekpere. Ha na-eche ka Jizọs gwa ha ihe ndị ọzọ ha ga-eme.

“A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze n’elu ụwa dum mmadụ bi ka ọ bụrụ àmà nye mba niile; mgbe ahụkwa ka ọgwụgwụ ga-abịa.”—Matiu 24:14