Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 94

Ndị Na-eso Ụzọ Jizọs Enweta Mmụọ Nsọ

Ndị Na-eso Ụzọ Jizọs Enweta Mmụọ Nsọ

Abalị iri Jizọs laghachiri eluigwe, ndị na-eso ụzọ ya nwetara mmụọ nsọ mgbe a na-eme Ememme Pentikọst nke afọ 33. Ndị mmadụ sikwa ebe dị iche iche bịa Jeruselem maka ememme a. Ihe dị ka ndị na-eso ụzọ Jizọs otu narị na iri abụọ zukọrọ n’otu ọnụ ụlọ dị n’elu. Na mberede, ihe dị ịtụnanya mere. Ihe dị ka ọkụ bịara dịrị n’isi onye nke ọ bụla n’ime ha, ha niile ebido kwuwa okwu n’asụsụ dị iche iche. Ụzụ eju n’ụlọ ahụ dị ka ebe oké ifufe na-efe.

Ndị si ebe dị iche iche bịa Jeruselem nụrụ ụzụ a ma gbara gaa n’ụlọ ahụ ka ha mara ihe na-emenụ. O juru ha anya mgbe ha nụrụ ka ndị na-eso ụzọ Jizọs na-ekwu okwu n’asụsụ dị iche iche. Ha jụrụ, sị: ‘Ndị a niile bụ ndị Galili. Oleezi otú ha si na-asụ asụsụ anyị?’

Ka ha nọ na-ekwu ihe a, Pita na ndịozi ndị ọzọ guzoro n’ihu ndị ahụ gbakọrọnụ. Pita gwara ha otú e si gbuo Jizọs nakwa na Jehova kpọlitere ya n’ọnwụ. Ọ sịrị: ‘Ugbu a, Jizọs nọ n’eluigwe n’aka nri Chineke. Ọ wụsara anyị mmụọ nsọ a o kwere anyị ná nkwa. Ọ bụ ya mere unu ji nụ ma hụ ọrụ ebube ndị a.’

Ihe ndị ahụ Pita kwuru ruru ìgwè mmadụ ahụ n’obi. Ha jụrụ ya, sị: “Gịnị ka anyị ga-eme?” Ọ gwara ha, sị: ‘Chegharịanụ ná mmehie unu, ka e meekwa unu baptizim n’aha Jizọs. A ga-enyekwa unu mmụọ nsọ.’ N’ụbọchị ahụ, e mere ihe dị ka puku mmadụ atọ baptizim. Si mgbe ahụ gawa, ndị na-eso ụzọ Jizọs malitere na-amụba n’ike n’ike na Jeruselem. Mmụọ nsọ mere ka ndịozi malite ọgbakọ ndị ọhụrụ ka ha nwee ike ịkụziri ndị na-eso ụzọ Jizọs ihe niile o nyere ha n’iwu.

“Ọ bụrụ na ị ga-eji ‘ọnụ gị’ kwusaa ‘okwu ahụ’ n’ihu ọha, na Jizọs bụ Onyenwe anyị, ma na-enwe okwukwe n’obi gị na Chineke si ná ndị nwụrụ anwụ kpọlite ya, a ga-azọpụta gị.”—Ndị Rom 10:9