Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 95

O Nweghị Ihe Ga-emeli Ka Ha Kwụsị Izi Ozi Ọma

O Nweghị Ihe Ga-emeli Ka Ha Kwụsị Izi Ozi Ọma

E nwere otu onye ngwọrọ na-anọ ọdụ n’ọnụ ụzọ ụlọ nsọ na-arịọ arịrịọ. N’ehihie otu ụbọchị, ọ hụrụ Pita na Jọn ka ha na-achọ ịbanye n’ụlọ nsọ. Ọ rịọrọ ha, sị: ‘Biko, nyetụnụ m ego.’ Pita sịrị ya: ‘M ga-enye gị ihe karịrị ego. N’aha Jizọs, bilie gawa ije.’ Pita jidere ya aka ma selite ya, ya amalite ịga ije. Obi tọrọ ndị nọ ebe ahụ ezigbo ụtọ n’ihi ihe a merenụ, ya emee ka ọtụtụ ndị kwere na Jizọs.

Ma ihe a were ndị nchụàjà na ndị Sadusii ezigbo iwe. N’ihi ya, ha jidere Pita na Jọn ma kpọrọ ha gaa n’ụlọikpe ndị Juu a na-akpọ Sanhedrin. Ha jụrụ ha, sị: ‘Ònye nyere unu ike unu ji gwọọ nwoke a?’ Pita zara ha, sị: ‘Ọ bụ Jizọs Kraịst, onye unu gburu.’ Ndị isi okpukpe ahụ sịrị ha: ‘Kwụsịnụ ikwu banyere Jizọs!’ Ma ndịozi ahụ kwuru, sị: ‘Anyị ga na-ekwu gbasara ya. Anyị agaghị akwụsị.’

Ozugbo ha hapụrụ Pita na Jọn, ha gakwuuru ndị na-eso ụzọ Jizọs ndị ọzọ ma kọọrọ ha ihe niile e mere ha. Ha niile kpere ekpere ma rịọ Jehova, sị: ‘Biko, nyere anyị aka ka anyị kata obi na-ekwusa ozi ọma.’ Jehova nyere ha mmụọ nsọ ya, ha anọgide na-ekwusa ozi ọma ma na-agwọ ndị ọrịa. Ọtụtụ ndị ghọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs. Ezigbo iwe were Ndị Sadusii nke na ha jidere ndịozi ahụ ma tụba ha n’ụlọ mkpọrọ. Ma, Jehova zigara mmụọ ozi ya n’abalị, ya agaa mepee ọnụ ụzọ ụlọ mkpọrọ ahụ ma gwa ndịozi ahụ, sị: ‘Laghachinụ n’ụlọ nsọ kwusawakwa ozi ọma.’

N’ụtụtụ echi ya, a gwara ụlọikpe ndị Juu ahụ, sị: ‘Ụlọ mkpọrọ ahụ ka gbachiri agbachi, ma ndị ahụ unu tụbara na ya anọghịzi ebe ahụ. Ha nọ n’ụlọ nsọ na-akụziri ndị mmadụ ihe.’ Ha jidere ndịozi ahụ ọzọ, kpọgakwa ha n’ụlọikpe ahụ. Nnukwu onye nchụàjà sịrị ha: ‘Ọ̀ kwa anyị gwara unu kwụsị ikwu banyere Jizọs?’ Ma, Pita zara ya, sị: ‘Anyị ga na-erubere Chineke isi ka onye na-achị achị karịa mmadụ.’

Ihe a ha kwuru were ndị isi okpukpe ahụ ezigbo iwe nke na ha chọwara igbu ha. Ma, otu onye Farisii aha ya bụ Gameliel biliri ọtọ ma sị ha: ‘Hapụnụ ndị a. O nwere ike ịbụ na Chineke nọnyeere ha. Ùnu chọrọ ịlụso Chineke ọgụ?’ Ha mere ihe ọ gwara ha. Ha pịara ndịozi ahụ ihe, gwa ha ọzọ ka ha kwụsị ikwusa ozi ọma, hapụzie ha ka ha laa. Ma, ihe a emeghị ka ha kwụsị. Ha katara obi na-ekwusa ozi ọma ma n’ụlọ nsọ ma n’ụlọ n’ụlọ.

‘Anyị ga na-erubere Chineke isi ka onye na-achị achị karịa mmadụ.’—Ọrụ Ndịozi 5:29