Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 97

Kọnịliọs Enweta Mmụọ Nsọ

Kọnịliọs Enweta Mmụọ Nsọ

E nwere otu onyeisi ndị agha Rom bi na Sesaria aha ya bụ Kọnịliọs. Ọ bụ onye a ma ama. Ọ bụ eziokwu na ọ bụghị onye Juu, ma, ndị Juu na-akwanyere ya ùgwù. Ọ na-enyere ndị ogbenye aka. Kọnịliọs nwere okwukwe na Jehova ma na-ekpe ekpere mgbe niile. Otu ụbọchị, otu mmụọ ozi bịakwutere ya ma gwa ya, sị: ‘Chineke anụla ekpere gị. Ugbu a, ziga mmadụ na Jọpa, bú ebe Pita nọ, ma gwa ya ka ọ bịa nyere gị aka.’ Ozugbo ọ gwachara ya okwu a, o zigara mmadụ atọ na Jọpa. Jọpa dị n’ebe ndịda Sesaria. Ọ dị ihe dị ka kilomita iri ise ma e si Sesaria gawa ya.

Ma, ka Pita nọ na Jọpa, ọ hụrụ ọhụụ. N’ọhụụ ahụ, ọ hụrụ anụ ndị a gwara ndị Juu erila. Ma, ọ nụrụ olu gwara ya rie ha. Pita jụrụ iri ha ma kwuo, sị: ‘Eritụbeghị m anụ na-adịghị ọcha mbụ.’ Olu ahụ gwakwara ya, sị: ‘Akpọla anụ ndị a ihe na-adịghị ọcha. Chineke emeela ka ha dị ọcha.’ Olu ahụ gwara ya, sị: ‘E nwere ụmụ nwoke atọ na-achọ gị. Ha nọ n’ọnụ ụzọ gị, soro ha gawa.’ Pita gara n’ọnụ ụzọ ya, hụ ha ma jụọ ha ihe mere ha ji bịa. Ha gwara ya, sị: ‘Ọ bụ Kọnịliọs, onyeisi agha ndị Rom, zitere anyị. Ọ sịrị ka a kpọọ gị, ka ị bịa n’ụlọ ya na Sesaria.’ Pita kpọbatara ha n’ụlọ ya ka ha nọrọ ka chi bọọ. N’echi ya, Pita na ụfọdụ ụmụnna nọ na Jọpa so ha gawa Sesaria.

Mgbe ha rutere, Kọnịliọs hụrụ Pita, daa n’ala n’ụkwụ ya ma kpọọrọ ya isiala. Ma, Pita sịrị ya : ‘Bilie. Abụ m mmadụ ibe gị. Chineke gwara m ka m bịa n’ụlọ gị, n’agbanyeghị na ndị Juu anaghị aga na nke ndị Jentaịl. Ugbu a, biko, gwa m ihe mere i ji sị m bịa.’

Kọnịliọs gwara Pita, sị: ‘Abalị anọ gara aga m nọ n’ekpe ekpere, otu mmụọ ozi gwara m ka m ziga mmadụ ka ha kpọọ gị. Biko, gwa anyị ihe Jehova chọrọ ka ị gwa anyị.’ Pita kwuru, sị: ‘Aghọtala m na Chineke anaghị ele mmadụ anya n’ihu. Ọ na-anabata onye ọ bụla chọrọ ife ya.’ Pita kụziiri ha ọtụtụ ihe gbasara Jizọs. Mgbe ọ nọ na-akụziri ha ihe, mmụọ nsọ dakwasịrị Kọnịliọs na ndị niile nọ ebe ahụ. E mekwara ha niile baptizim.

“Ná mba ọ bụla, onye na-atụ egwu [Chineke] ma na-eme ezi omume bụ onye ọ na-anabata nke ọma.”—Ọrụ Ndịozi 10:35