Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 98

Otú Ozi Ọma Si Ruo n’Ọtụtụ Obodo

Otú Ozi Ọma Si Ruo n’Ọtụtụ Obodo

Ndịozi Jizọs rubere isi n’iwu o nyere ha izi ozi ọma n’ụwa niile. N’afọ 47, ụmụnna nọ n’Antiọk zipụrụ Pọl na Banabas ka ha gaa zie ozi ọma n’ebe dị iche iche. Ụmụnna abụọ a gara obodo dị iche iche dị n’Eshia Maịnọ zie ozi ọma. Ụfọdụ obodo ndị ahụ bụ Dabe, Listra na Aịkoniọm.

Pọl na Banabas ziri ụdị mmadụ niile ozi ọma. Ọtụtụ ndị bịara kwere na Kraịst. Mgbe Pọl na Banabas na-ezi Sajiọs Pọlọs bụ́ gọvanọ Saịprọs, ozi ọma, otu dibịa afa chọrọ ime ka ha ghara izi ya ozi ọma. Pọl gwara ya, sị: ‘Jehova ga-eme gị ihe.’ Ozugbo ahụ, dibịa ahụ kpuru ìsì. Mgbe Gọvanọ Pọlọs hụrụ ihe a merenụ, ya ekwere na Jizọs.

Pọl na Banabas ziri ozi ọma ebe niile, ma n’ụlọ n’ụlọ ma n’ahịa ma n’ụzọ ma n’ụlọ nzukọ. Mgbe ha gwọrọ otu onye ngwọrọ na Listra, ndị nọ ebe ahụ chere na ha bụ chi, ha achọọ ife ha. Ma, Pọl na Banabas ekweghị ka ndị ahụ fee ha. Ha gwara ha, sị: ‘Ọ bụ naanị Chineke ka unu kwesịrị ife. Anyị bụ mmadụ ibe unu.’ Ka ha nọ na-ekwu ihe a, ụfọdụ ndị Juu bịara mee ka ndị niile nọ ebe ahụ nyewe Pọl nsogbu. Ha tụrụ ya nkume, kpụrụ ya gaa n’azụ obodo, chee na ọ nwụọla. Ma, Pọl anwụbeghị. Ụmụnna ndị bi n’obodo ahụ bịara ozugbo nyere ya aka, ma kpọrọ ya laghachi n’ime obodo. Mgbe e mechara, Pọl laghachiri Antiọk.

N’afọ 49, Pọl gakwara zie ozi ọma nke ugboro abụọ ya n’obodo dị iche iche. Ma, ọ gaghachiri n’ebe ndị o ziri ozi ọma n’Eshia Maịnọ ka ọ mata otú ụmụnna nọ ebe ahụ mere. Mgbe o mechara, ọ gawara obodo ndị dị na Yurop zie ozi ọma. Ha bụ Atens, Efesọs, Filipaị, na Tesalonaịka na obodo ndị ọzọ. Saịlas, Luk na otu nwa okorobịa aha ya bụ Timoti so Pọl gaa ebe ndị ahụ. Ha hiwere ọgbakọ dị iche iche, meekwa ka okwukwe ụmụnna sie ike. Pọl nọrọ na Kọrịnt otu afọ na ọnwa isii na-eme ka okwukwe ụmụnna sikwuo ike. O ziri ndị mmadụ ozi ọma, kụziere ha ihe ma degara ọtụtụ ọgbakọ akwụkwọ ozi. Aka ọru ya bụ ịkpa ákwà ụlọikwuu. Mgbe obere oge gara, ọ laghachiri Antiọk.

N’afọ 52, Pọl gakwara ozi ọma nke ugboro atọ ya n’obodo ụfọdụ. Ọ malitere n’Eshia Maịnọ. Ọ gara Filipaị na Kọrịnt. Pọl nọrọ ọtụtụ afọ n’Efesọs kụziere ndị mmadụ ihe, gwọọ ndị ọrịa, nyekwara ọgbakọ nọ ebe ahụ aka. N’ụbọchị ọ bụla, ọ gwara ndị mmadụ okwu n’ụlọ ezumezu nke otu ụlọ akwụkwọ dị ebe ahụ. Ọtụtụ ndị gere ya ntị ma kwụsị ihe ọjọọ ndị ha na-eme. Mgbe Pọl zichara ozi ọma n’ọtụtụ obodo, ọ gara Jeruselem.

“Gaanụ mee ndị mba niile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m.”—Matiu 28:19