Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 99

Onye Na-elekọta Ụlọ Mkpọrọ Aghọọ Onye Kraịst

Onye Na-elekọta Ụlọ Mkpọrọ Aghọọ Onye Kraịst

E nwere otu nwa agbọghọ na-ejere mmadụ ozi na Filipaị. Mmụọ ọjọọ ji ya. Mmụọ ọjọọ a mere ka ọ na-akọrọ ndị mmadụ ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu. Ihe a ọ na-eme na-enyekwa ndị nwe ya nnukwu ego. Mgbe Pọl na Saịlas bịara na Filipaị, o so ha na-agagharị ruo ọtụtụ ụbọchị. Mmụọ ọjọọ ahụ mere ka ọ na-eti mkpu, sị: “Ndị a bụ ndị ohu nke Chineke Onye Kasị Elu.” Pọl gwara mmụọ ọjọọ ahụ, sị: ‘Ana m enye gị iwu n’aha Jizọs ka i si n’ime ya pụta.’ Ya esi n’ime nwa agbọghọ ahụ pụta.

Mgbe ndị nwe nwa agbọghọ ahụ hụrụ na ha agaghị na-ejizi nwa ahụ enweta ego, ezigbo iwe were ha. Ha kpụụrụ Pọl na Saịlas gakwuru ndị na-achị obodo. Ha gwara ha, si: ‘Ndị a na-emebi iwu obodo anyị, na-enyekwa obodo anyị niile nsogbu.’ Ndị ahụ na-achị obodo nyere iwu ka a pịa Pọl na Saịlas ihe ma tụba ha n’ụlọ mkpọrọ. Onye na-elekọta ụlọ mkpọrọ ahụ tụbara ha n’ọnụ ụlọ mkpọrọ dị n’ime ime ma kpọchie ụkwụ ha n’ọtọsị.

Pọl na Saịlas bidoro iji abụ na-eto Jehova, ndị mkpọrọ ndị ọzọ ana-ege ha ntị. N’etiti abalị, oké ala ọma jijiji mere na mberede, ụlọ mkpọrọ ahụ niile amawa jijiji. Ibo ụzọ ya niile meghekwara, agbụ e kere ndị mkpọrọ ahụ niile tọpụkwara. Onye na-elekọta ụlọ mkpọrọ ahụ ji ọsọ gbaba n’ime ime, ma hụ na ụzọ ya niile meghechara emeghe. O chere na ndị mkpọrọ ahụ niile agbaala ọsọ, ya amịrị mma agha chọọ igbu onwe ya.

Mgbe ọ na-achọ igbu onwe ya, Pọl tiri mkpu, sị: ‘Egbula onwe gị! Anyị niile nọ n’ebe a!’ Onye na-elekọta ụlọ mkpọrọ ahụ mabara n’ime ma daa n’ala n’ihu Pọl na Saịlas. Ọ jụrụ ha, sị: “Gịnị ka m ga-eme ka a zọpụta m?” Ha gwara ya, sị: ‘Gị na ezinụlọ gị ga-ekwere na Jizọs.’ Pọl na Saịlas maliteziri ịkụziri ha banyere Jehova. E mekwara nwoke ahụ na ezinụlọ ya baptizim.

“Ndị mmadụ ga-ejide unu ma kpagbuo unu, kpụrụ unu gaa n’ụlọ nzukọ, tụbakwa unu n’ụlọ mkpọrọ, a ga-akpụgakwa unu n’ihu ndị eze na ndị gọvanọ n’ihi aha m. Ọ ga-aghọrọ unu ohere iji gbaa àmà.”​—Luk 21:12, 13