Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 103

“Ka Alaeze Gị Bịa”

“Ka Alaeze Gị Bịa”

Jehova kwere anyị nkwa, sị: ‘Ịkwa ákwá, ihe mgbu, ọrịa ma ọ bụ ọnwụ agaghịkwa adị ọzọ. M ga-ehichapụ anya mmiri niile n’anya ha. Agaghịkwa na-echeta ihe ọjọọ niile mere n’oge gara aga.’

Jehova tinyere Adam na Iv n’ogige Iden ka ha biri n’udo ma na-enwe obi ụtọ. Ebe ọ bụ Nna ha nke eluigwe, ọ chọrọ ka ha na-efe ya, chọọkwa ka ha mụọ ụmụ mụjuo ụwa. Ma, Adam na Iv nupụụrụ Jehova isi. Ihe a emeghị ka Chineke gbanwee ihe ahụ o bu n’uche. N’akwụkwọ a, anyị ahụla na Chineke na-emezu ihe ọ bụla o kwere ná nkwa. Ọ ga-eji Alaeze ya gọzie ụwa niile, otú ahụ o kwere Ebreham ná nkwa.

N’oge na-adịghị anya, Setan, ndị mmụọ ọjọọ ya, na ndị ọjọọ niile agaghịzi adị. Onye ọ bụla ga na-efe naanị Jehova. Anyị agaghịzi na-arịa ọrịa ma ọ bụ na-anwụ anwụ. Ụbọchị ọ bụla anyị tetara ụra, ahụ́ ga-agbasi anyị ike, obi ana-atọkwa anyị ụtọ na anyị dị ndụ. Ụwa ga-aghọ paradaịs. Onye ọ bụla ga na-enwe ezigbo nri ọ ga-eri, birikwa n’ezigbo ụlọ nke ya. Ndị mmadụ ga na-adị obiọma, enweghịzi onye ga na-eme ibe ya ihe ọjọọ. Anụ ọhịa agaghịzi na-atụ anyị ụjọ, anyị agaghịkwa na-atụ ha ụjọ.

Obi ga-atọgbu onye ọ bụla atọgbu mgbe Jehova ga-amalite ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ. Anyị ga-anabata ndị fere Chineke n’oge ochie. Ụfọdụ n’ime ha bụ Ebel, Noa, Ebreham, Sera, Mozis, Rut, Esta na Devid. Ha ga-eso anyị mee ka Ụwa bụrụ paradaịs. A ga na-enwe ọrụ ndị na-atọ ụtọ anyị ga na-arụ mgbe niile.

Jehova chọrọ ka i biri na paradaịs. Ị ga-amatakwu Jehova karịa otú ị ma ya ugbu a. N’ihi ya, ka anyị gbalịa na-abịarukwu ya nso kwa ụbọchị, nakwa ruo mgbe ebighị ebi.

“I kwesịrị ekwesị, Jehova, bụ́ Chineke anyị, ịnata otuto na nsọpụrụ na ike, n’ihi na ọ bụ gị kere ihe niile, ọ bụkwa n’ihi uche gị ka ha ji dịrị, ọ bụkwa ya mere e ji kee ha.”—Mkpughe 4:11