Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe A Na-aga Ịkọ ná Nkebi nke 1

Ihe A Na-aga Ịkọ ná Nkebi nke 1

Ihe mbụ a kọrọ na Baịbụl bụ otú Jehova si kee eluigwe na ụwa. Akụkọ a mere ka anyị mata ọmarịcha ihe ndị Jehova kere ma n’eluigwe ma n’ụwa. Ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna, nyere nwa gị aka ka ọ ghọta ihe dị iche iche dị ịtụnanya Chineke kere. Nyekwara ya aka ka ọ ghọta na Chineke kere mmadụ ka ha ka anụmanụ. O kere mmadụ ka o nwee ike ikwu okwu, iche echiche, imepụta ihe, ịbụ abụ na ikpe ekpere. Mee ka ọ ghọta ụdị ike na amamihe Jehova nwere, nke ka nke, otú o si hụ ihe niile o kere n’anya, ma onye ọ bụla n’ime anyị.

NÁ NKEBI A

ISI NKE 1

Chineke Ekee Eluigwe na Ụwa

Baịbụl kwuru na Chineke kere eluigwe na ụwa. Gịnị mere o ji buru ụzọ kee otu mmụọ ozi tupu ya ekee onye ọ bụla ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ?

ISI NKE 2

Chineke Ekee Nwoke Mbụ na Nwaanyị Mbụ

Chineke ekee nwoke mbụ na nwaanyị mbụ, ma mee ka ha biri n’ogige Iden. Ọ chọrọ ka ha mụọ ụmụ, meekwa ka ụwa niile bụrụ paradaịs.