Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe A Na-aga Ịkọ ná Nkebi nke 2

Ihe A Na-aga Ịkọ ná Nkebi nke 2

Gịnị mere Jehova ji mee ka e nwee iju mmiri nke bibiri ndị ajọ omume n’oge ochie? Obere oge e kechara mmadụ, a chọrọ ka ha họrọ ma hà ga-eme ihe dị mma ma ọ bụ ihe na-adịghị mma. Adam na Iv, na nwa ha Ken, họọrọ ime ihe na-adịghị mma. Mmadụ ole na ole, dị ka Ebel na Noa họọrọ ime ihe dị mma. Ọtụtụ mmadụ malitere ime ihe ọjọọ nke na Jehova bibiri ndị niile na-eme ihe ọjọọ n’oge ahụ. Nkebi a ga-eme ka anyị mata na Jehova na-ahụ ma ànyị na-eme ihe dị mma ma ọ bụ ihe na-adịghị mma. Ọ ga-emekwa ka anyị mata na enweghị mgbe Jehova ga-ekwe ka ihe ọjọọ merie ihe ọma.

NÁ NKEBI A

ISI NKE 3

Adam na Iv Enupụrụ Chineke Isi

Gịnị mere otu osisi nọ n’ogige Iden ji pụọ iche? Gịnị mere Iv ji rie mkpụrụ osisi ya?

ISI NKE 4

O Gburu Nwanne Ya n’Ihi Iwe

Chineke nabatara àjà Ebel chụụrụ ya ma jụ nke Ken. Mgbe Ken hụrụ na Chineke jụrụ àjà ya, o were ezigbo iwe, ma mee ihe jọgburu onwe ya.

ISI NKE 5

Ụgbọ Noa

Ndị mmụọ ozi ahụ mere ihe ọjọọ lụrụ nwaanyị, mụọ ụmụ gbara dimkpa. Ime ihe ike bịara ju n’ụwa. Noa dị iche, hụ Jehova n’anya, na-erubekwara ya isi.

ISI NKE 6

Chineke Echebe Mmadụ Asatọ n’Oge Ochie

Mmiri ahụ e ji bibie ụwa, zoro ụbọchị iri anọ ehihie na abalị. Noa na ezinụlọ ya nọrọ n’ụgbọ ahụ ihe karịrị otu afọ. Chineke emechaa gwa ha pụta.