Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe A Na-aga Ịkọ ná Nkebi nke 3

Ihe A Na-aga Ịkọ ná Nkebi nke 3

Mgbe Iju Mmiri ahụ gachara, Baịbụl gwara anyị aha mmadụ ole na ole fere Jehova. Otu n’ime ha bụ Ebreham. A kpọrọ ya enyi Jehova na Baịbụl. Gịnị mere e ji kpọọ ya enyi Jehova? Ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna, nyere nwa gị aka ka ọ mata na Jehova hụrụ ya n’anya, chọọkwa inyere ya aka. Anyị nwere ike iji obi anyị niile rịọ Jehova ka o nyere anyị aka otú ahụ Ebreham, Lọt na Jekọb mere. Obi kwesịrị isi anyị ike na Jehova ga-emezu nkwa niile o kwere anyị.

NÁ NKEBI A

ISI NKE 7

Ụlọ Elu Bebel

Ụfọdụ ndị malitere iwu obodo na ụlọ elu ga-eru eluigwe. Gịnị mere Chineke ji mee ka ha sụwa asụsụ dị iche iche na mberede?

ISI NKE 8

Ebreham na Sera Erubere Chineke Isi

Gịnị mere Ebreham na Sera ji hapụ ụlọ ha na Ọọ ma gaa na-ebi ebe dị iche iche n’ala Kenan?

ISI NKE 9

Ebreham na Sera Emechaa Mụta Nwa.

Olee otú Chineke ga-esi mezuo nkwa ahụ o kwere Ebreham? Ọ̀ bụ Aịzik ka ọ̀ bụ Ishmel ka ọ ga-esi n’aka ya mezuo nkwa a?

ISI NKE 10

Cheta Nwunye Lọt

Chineke mere ka ọkụ na sọlfọ zokwasị Sọdọm na Gọmọra. Gịnị mere o ji bibie obodo ndị ahụ? Gịnị mere anyị ga-eji cheta nwunye Lọt?

ISI NKE 11

Chineke Elee Okwukwe Ebreham Ule

Chineke gwara Ebreham, sị: ‘Biko, kpọrọ nwa gị nwoke ị mụrụ naanị ya, gaa n’ugwu Moraya jiri ya chụọrọ m àjà.’ Ebreham ọ̀ ga-emenụ ihe Chineke gwara ya mee?

ISI NKE 12

Jekọb Eketa Ihe A Na-ekenye Ọkpara

Aịzik na Ribeka mụrụ ejima. Ha bụ Isọ na Jekọb. Isọ bụ nke mbụ, e kwesịrị inye ya ihe ruuru ọkpara. Gịnị mere o ji nye ya Jekọb n’ihi efere ofe?

ISI NKE 13

Jekọb na Isọ Ekpezie

Olee otú mmụọ ozi si gọzie Jekọb? Olee otú Jekọb na Isọ si kpezie?