Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe A Na-aga Ịkọ ná Nkebi nke 4

Ihe A Na-aga Ịkọ ná Nkebi nke 4

Nkebi a ga-akọrọ anyị gbasara Josef, Job, Mozis na ndị Izrel. Ha niile diri nsogbu Ekwensu kpataara ha. E megburu ụfọdụ n’ime ha, tụọ ụfọdụ mkpọrọ, jiri ụfọdụ mere ohu, gbuodị ụfọdụ ndị ezinụlọ ha. Ma, Jehova si n’ụzọ dị iche iche chebe ha. Ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna, nyere nwa gị aka ka ọ ghọta otú ndị ohu Jehova ndị ahụ si fee ya n’agbanyeghị ahụhụ ha tara.

Jehova ji Ihe Otiti Iri o tiri ndị Ijipt gosi na ya ka chi ha niile ike. Mee ka nwa gị ghọta otú Jehova si chebe ndị ya n’oge gara aga na otú o si na-echebe ndị ya taa.

NÁ NKEBI A

ISI NKE 14

Otu Ohu nke Rubeere Chineke Isi

Gịnị mere Josef ji taa ezigbo ahụhụ n’agbanyeghị na o mere ihe ziri ezi?

ISI NKE 15

Jehova Echefughị Josef

Ọ bụ eziokwu na Josef na nne na nna ya, nakwa ụmụnne ya ebighị nso, Chineke gosiri ya na ọ nọnyeere ya.

ISI NKE 16

Ònye Bụ Job?

Job rubeere Jehova isi, ma mgbe ihe siiri ya ike.

ISI NKE 17

Mozis Ahọrọ Ife Jehova

Egbughị Mozis n’ihi na nne ya katara obi zoo ya.

ISI NKE 18

Osisi nke Ọkụ Na-enwu Na Ya

Gịnị mere ọkụ ereghị osisi ahụ ọkụ na-enwu na ya?

ISI NKE 19

Ihe Otiti Atọ Ndị Mbụ E Tiri Ndị Ijipt

Fero kpataara ndị obodo ya nsogbu n’ihi na mpako mere ka ọ ghara ime ihe Jehova gwara ya mee.

ISI NKE 20

Ihe Otiti nke Anọ Ruo na nke Itoolu

Gịnị mere ihe otiti isii a ji dị iche n’atọ ndị mbụ?

ISI NKE 21

Ihe Otiti nke Iri

Ihe otiti a gbawara ndị Ijipt obi nke na Fero, bụ́ onye mkpako, kwetaziri ka ndị Izrel laa.

ISI NKE 22

Ọrụ Ebube Jehova Rụrụ n’Osimiri Uhie

Fero anwụghị n’ihe otiti iri ndị ahụ, ma ọ̀ lanahụrụ ọrụ ebube a Chineke rụrụ n’Osimiri Uhie?