Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe A Na-aga Ịkọ ná Nkebi nke 5

Ihe A Na-aga Ịkọ ná Nkebi nke 5

Ọnwa abụọ ndị Izrel gafechara Oké Osimiri Uhie, ha rutere n’Ugwu Saịnaị. Ha na Jehova nọ ebe ahụ gbaa ndụ, ha aghọọrọ ya mba pụrụ iche. O chebere ha ma nye ha ihe niile ha chọrọ. O nyere ha mana ka ha rie, nyekwa ha ebe ndị dị mma ha mara ụlọikwuu. O mekwara ka uwe ha yi ghara ịka aka. Ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna, nyere nwa gị aka ka ọ ghọta ihe mere Jehova ji nye ndị Izrel Iwu, nye ha ndị nchụàjà, ma gwa ha rụọ ụlọikwuu. Mee ka ọ ghọta ihe mere anyị ji kwesị ịna-emezu nkwa anyị kwere, ịna-adị umeala n’obi ma na-erubere Jehova isi mgbe niile.

NÁ NKEBI A

ISI NKE 23

Ndị Izrel Ekwe Jehova Nkwa

Ndị Izrel kwere Chineke nkwa pụrụ iche mgbe ha mara ụlọikwuu n’Ugwu Saịnaị.

ISI NKE 24

Ha Emeghị Ihe Ha Kwuru

Ndị Izrel mere mmehie jọgburu onwe ya mgbe Mozis gara n’ugwu ka Chineke nye ya Iwu Iri ahụ.

ISI NKE 25

Ndị Izrel Arụọ Ụlọikwuu Ha Ga-anọ Na-efe Chineke

Igbe ọgbụgba ndụ dị n’ụlọikwuu a pụrụ iche.

ISI NKE 26

Ndị Nledo Iri na Abụọ

Jọshụa na Keleb dị iche na mmadụ iri ndị ọzọ so ledo ala Kena.

ISI NKE 27

Ha Nupụụrụ Jehova Isi

E nwere ihe dị mkpa banyere Jehova, Detan, Abaịram na narị ndị ikom abụọ na iri ise chefuru.

ISI NKE 28

Ịnyịnya Ibu Belam Ekwuo Okwu

Belam ahụghị onye ịnyịnya ya na-ahụ.