Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe A Na-aga Ịkọ ná Nkebi nke 6

Ihe A Na-aga Ịkọ ná Nkebi nke 6

Mgbe ndị Izrel mechara banye n’Ala Nkwa ahụ, ụlọikwuu ahụ bịara bụrụ ebe ha na-anọ efe Jehova ofufe dị ọcha. Ndị nchụàjà kụziiri ha Iwu Chineke, ndị ikpe ana-eduzi ha. Nkebi a gosiri otú mkpebi ndị anyị na-eme na àgwà anyị nwere ike isi bara ndị ọzọ uru ma ọ bụ kpatara ha nsogbu. Onye Izrel ọ bụla kwesịrị irubere Jehova isi, na-emekwara mmadụ ibe ya ihe ọma. Mee ka ọ ghọta otú Debora, Neomi, Jọshụa, Hana, ada Jefta na Samuel si baara ndị obodo ha uru. Meekwa ka ọ ghọta otú Rehab, Rut, Jeel, na ndị Gibiọn si kwado ndị Izrel n’ihi na ha ma na Chineke nọnyeere ha n’agbanyeghị na ha abụghị ndị Izrel.

NÁ NKEBI A

ISI NKE 29

Jehova Ahọrọ Jọshụa Ka O Duwezie Ndị Izrel

Chineke gwara Jọshụa ihe ndị ga-enyekwara anyị aka taa.

ISI NKE 30

Rehab Ezoo Ndị Bịara Ile Otú Jeriko Dị

Mgbidi Jeriko daruru ala. Ma, ụlọ Rehab adaghị n’agbanyeghị na arụkọtara ya na mgbidi ahụ.

ISI NKE 31

Jọshụa na Ndị Gibiọn

Jọshụa rịọrọ Chineke, sị: “Anyanwụ, guzoro otu ebe!” Chineke ọ̀ zara ya ekpere a?

ISI NKE 32

Onye Ndú Ọhụrụ na Ụmụ Nwaanyị Abụọ Katara Obi

Mgbe Jọshụa nwụchara, ndị Izrel malitere ife arụsị ma taa ezigbo ahụhụ. Jehova ji Berak Onyeikpe, Debora onye amụma nwaanyị na Jeel na ntu ya nyere ha aka.

ISI NKE 33

Rut na Neomi

Ụmụ nwaanyị abụọ di ha nwụrụ laghachiri Izrel. Otu n’ime ha aha ya bụ Rut, gara na-arụ ọrụ n’ubi Boaz, Boaz ahụ ya.

ISI NKE 34

Gidiọn E Merie Ndị Midian

Ndị Midian mesiri ndị Izrel ike, ndị Izrel rịọrọ Jehova ka o nyere ha aka. Olee otú ndị agha Gidion ole na ole ji merie ndị agha Midian dị ọtụtụ?

ISI NKE 35

Hana Ekpee Ekpere Ka Ọ Mụta Nwa

Elkana na-akpọrọ Hana, Peninna, na ụmụ ha aga efe Chineke na Shaịlo. Hana nọ ebe ahụ rịọ Chineke ka o nye ya nwa. Mgbe otu afọ gachara, ya amụọ Samuel.

ISI NKE 36

Jefta Ekwe Jehova Nkwa

Olee nkwa Jefta kwere Jehova, gịnị mere o ji kwe ya? Olee ihe ada Jefta mere mgbe ọ nụrụ banyere nkwa a nna ya kwere Jehova?

ISI NKE 37

Jehova Agwa Samuel Okwu

Ilaị, bụ́ nnukwu onye nchụàjà, nwere ụmụ abụọ na-eje ozi n’ụlọikwuu. Ha anaghị erubere Chineke isi. Ma, Samuel dị iche. Otu abalị, Jehova gwara ya okwu.

ISI NKE 38

Jehova Mere Ka Samsịn Sie Ike

Chineke mere ka Samsọn sie ike iji na-alụso ndị Filistia agha. Ma, mgbe o mere mkpebi na-adịghị mma, ndị Filistia jidere ya.