Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe A Na-aga Ịkọ ná Nkebi nke 7

Ihe A Na-aga Ịkọ ná Nkebi nke 7

Nkebi a ga-akọrọ anyị gbasara Eze Sọl na Eze Devid. Ihe ahụ niile mere ruo n’ihe dị ka afọ iri asatọ. Mgbe Sọl ghọrọ eze, ọ dị umeala n’obi ma na-atụ egwu Chineke. Obere oge, ya agbanwee, kwụsị ịna-erubere Jehova isi. Ihe a mere ka Jehova jụ ya. Ka oge na-aga, Jehova gwara Samuel ka o tee Devid mmanụ ka ọ bụrụ eze ọzọ ga-achị ndị Izrel. Sọl nweere Devid anyaụfụ, ma gbaa mbọ ọtụtụ ugboro ka o gbuo Devid. Ma, Devid emeghị ya ihe ọ bụla. Jọnatan nwa Sọl ma na Jehova ahọrọla Devid ka ọ chịwa Izrel. Ọ bụ ya mere o ji kwado Devid. Devid mere mmehie ndị jọgburu onwe ha, ma ọ nabatara aka ná ntị Jehova dọrọ ya. Ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna, nyere nwa gị aka ka ọ ghọta ihe mere anyị ji kwesị ịna-erubere Jehova isi.

NÁ NKEBI A

ISI NKE 39

Eze Mbụ Chịrị Izrel

Chineke nyere ndị Izrel ndị ikpe ka ha na-edu ha. Ha chọrọ eze ga na-achị ha. Samuel tere Sọl mmanụ ịbụ eze mbụ ha, Jehova mechara jụ Sọl. N’ihi gịnị?

ISI NKE 40

Devid na Golayat

Jehova họọrọ Devid ka ọ bụrụ eze ọzọ ga-achị Izrel. Devid gosikwara ihe mere ya ji kwesị ịbụ eze.

ISI NKE 41

Devid na Sọl

Gịnị mere Sọl ji kpọọ Devid asị, oleekwa ihe Devid mere?

ISI NKE 42

Jonatan Bụ Dike na Ezigbo Enyi Devid

Otu nwa eze ghọrọ ezigbo enyi Devid.

ISI NKE 43

Eze Devid Emee Mmehie

Mkpebi na-adịghị mma Devid mere kpataara ya ọtụtụ nsogbu.