Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe A Na-aga Ịkọ ná Nkebi nke 8

Ihe A Na-aga Ịkọ ná Nkebi nke 8

Jehova nyere Solomon amamihe dị egwu. O kwekwara ka ọ rụọrọ ya ụlọ nsọ. Ma, Solomon ji nwayọọ nwayọọ kwụsị ife Chineke. Ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna, mee ka nwa gị ghọta otú arụsị Solomon malitere ife si mee ka ọ kwụsị ife Chineke. E mechara kewaa alaeze Izrel ụzọ abụọ. Ndị eze chịrị ndị Izrel mere ka ha kwụsị ife Chineke fewezie arụsị. N’oge ahụ, e mesiri ọtụtụ ndị amụma ji obi ha niile na-efe Jehova ike, gbuokwa ha. Eze Nwaanyị aha ya bụ Jezibel mere ka ọtụtụ ndị nọ n’alaeze ebe ugwu kwụsị ife Jehova ma fewe arụsị. E nwere nsogbu n’Izrel oge ahụ. Ma, a ka nwere ọtụtụ ndị na-efe Jehova n’Izrel n’oge ahụ. Ụfọdụ n’ime ha bụ Eze Jehoshafat na Ịlaịja.

NÁ NKEBI A

ISI NKE 44

Ụlọ Nsọ A Rụụrụ Jehova

Chineke meere Solomon ihe ọ rịọrọ ya, ma meere ya ọtụtụ ihe ọma.

ISI NKE 45

Chineke Ekewaa Alaeze Izrel

Ọtụtụ ndị Izrel kwụsịrị ife Jehova.

ISI NKE 46

Jehova Egosi na Ya Bụ Ezi Chi

Ònye bụ ezi Chineke? Ọ̀ bụ Jehova ka ọ̀ bụ Bel?

ISI NKE 47

Jehova Emee Ka Obi Sikwuo Ịlaịja Ike

Ì chere na Chineke nwere ike ime ka obi sikwuo gị ike ka Ịlaịja?

ISI NKE 48

Ịlaịja Akpọlite Nwa Otu Nwaanyị Di Ya Nwụrụ n’Ọnwụ

Ịlaịja rụrụ ọrụ ebube abụọ n’otu ụlọ.

ISI NKE 49

Jehova Egbuo Eze Nwaanyị Ọjọọ

Jezibel kpara nkata ka o gbuo Nebọt iji nara ya ubi vaịn ya. Jehova kwụrụ ya ụgwọ ihe ọjọọ a o mere.

ISI NKE 50

Jehova Enyere Jehoshafat Aka

Mgbe ndị iro Juda bịara ịlụso ya ogụ, Jehoshaphat, bụ́ ezigbo Eze, rịọrọ Chineke ka o nyere ha aka.