Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe A Na-aga Ịkọ ná Nkebi nke 9

Ihe A Na-aga Ịkọ ná Nkebi nke 9

Nkebi a ga-akọ banyere ndị na-eto eto, ndị amụma, na ndị eze mere ihe gosiri na ha nwere ezigbo okwukwe na Jehova. Na Siria, otu nwata nwaanyị nwere okwukwe n’Ịlaịsha ga-agwọli Neaman. Ịlaịsha onye amụma tụkwasịrị Jehova obi ya niile na ọ ga-anapụta ya n’aka ndị agha chọrọ igbu ya. Jehoyada, Nnukwu Onye Nchụàjà chebere otu nwata nwoke aha ya bụ Jehoash ka nne nna ya ghara igbu ya. Jehoyada katara obi chebe Jehoash n’agbanyeghị na e nwere ike igbu ya. Aha nne nna Jehoash bụ Atalaya. Eze Hezekaya tụkwasịrị Jehova obi na ọ ga-anapụta Jeruselem n’aka ndị Asiria. O kweghị achịliri ha aka elu n’agbanyeghị ụjọ ha na-emenye ya. Eze Josaya bibiri arụsị niile ndị Izrel na-efe, mee ka ụlọ nsọ Chineke dịrị ọcha, meekwa ka ndị Izrel maliteghachi ife Chineke.

NÁ NKEBI A

ISI NKE 51

Otu Nwatakịrị Nwaanyị Enyere Dike n’Agha Aka

Otu nwatakịrị onye Izrel agwa nne ya ukwu otú Jehova si e ji ike dị ukwuu o nwere agwọ ọrịa.

ISI NKE 52

Ndị Agha Jehova Nọ n’Ịnyịnya Ndị Na-acha Ọkụ Ọkụ

Olee otú onye na-ejere Ịlaịsha ozi si mata na ‘ndị anyị na ha nọ karịrị ndị ha na ha nọ.’

ISI NKE 53

Otú Jehoyada Si Kata Obi

Otu onye nchụàjà na-efe Chineke akata obi gbuo otu eze nwaanyị ọjọọ.

ISI NKE 54

Jehova Nweere Jona Ndidi

Gịnị mere otu nnukwu azụ̀ ji loo otu onye amụma Chineke? Olee otú o si pụta n’afọ ya? Olee ihe Jehova ji ihe a kụziere ya?

ISI NKE 55

Mmụọ Ozi Jehova Anapụta Hezekaya

Ndị iro Juda kwuru na Jehova agaghị anapụta ha. Ma ihe a ha kwuru abụghị eziokwu.

ISI NKE 56

Josaya Ji Iwu Chineke Kpọrọ Ihe

Josaya ghọrọ eze mgbe ọ dị afọ asatọ. O nyekwaara ndị obodo ya aka ife Jehova.