Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe A Na-aga Ịkọ ná Nkebi nke 11

Ihe A Na-aga Ịkọ ná Nkebi nke 11

Ihe anyị na-aga ịkọ ná nkebi a bụ ihe ndị a kọrọ n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst. A mụrụ Jizọs n’ezinụlọ na-abaghị ọgaranya. Nna ya bụ ọkwá nkà, o sokwa ya rụọ ọrụ a. Jizọs bụ onye Chineke ga-esi n’aka ya zọpụta ndị mmadụ. Jehova ahọrọla ya ka ọ bụrụ Eze nke Alaeze eluigwe. Ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna, nyere nwa gị aka ka ọ ghọta ihe mere Jehova ji họrọ ezinụlọ ahụ a mụrụ Jizọs na ya, nakwa ka ọ bụrụ ebe ahụ ka ọ ga-anọ too. Nyekwara ya aka ka ọ ghọta otú Jehova si chebe Jizọs ka Herọd ghara igbu ya, nakwa na e nweghị ihe ga-eme ka Jehova ghara imezu ihe o kwuru. Gị na ya mụọ otú Jehova si jiri Jọn kwadebere Jizọs ụzọ. Meekwa ka ọ ghọta ihe Jizọs mere malite mgbe ọ na-etolite iji gosi na o jighị Okwu Chineke egwu egwu.

NÁ NKEBI A

ISI NKE 68

Elizabet Amụọ Nwa

Gịnị mere e ji gwa di Elizabet na ọ gaghị ekwu okwu ruo mgbe nwunye ya mụrụ nwa?

ISI NKE 69

Gebriel Eleta Meri

O ziri ya ozi gbanwere ndụ ya.

ISI NKE 70

Ndị Mmụọ Ozi Emee Ka A Mata na A Mụọla Jizọs

Mgbe ndị mmụọ ozi gwara ndị ọzụzụ atụrụ na a mụọla Jizọs, ndị ọzụzụ atụrụ gawara Jeruselem ozugbo.

ISI NKE 71

Jehova Chebere Jizọs

Otu eze ọjọọ chọrọ ka e gbuo Jizọs.

ISI NKE 72

Mgbe Jizọs Dị Afọ Iri na Abụọ

Olee ihe o mere nke juru ndị na-akuzi ihe n’ụlọ nsọ anya?

ISI NKE 73

Jọn Akwadebe Ndị Mmadụ Maka Ọbịbịa Jizọs

Jọn ghọrọ onye amụma mgbe o toro. Ọ gwara ndị mmadụ na Mezaya na-abịa. Olee ihe ha mere n’ihe a ọ gwara ha?