Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe A Na-aga Ịkọ ná Nkebi nke 12

Ihe A Na-aga Ịkọ ná Nkebi nke 12

Jizọs kụziiri ndị mmadụ banyere Alaeze eluigwe. Ọ kụzikwaara ha ka ha na-ekpe ekpere ka e doo aha Chineke nsọ, ka Alaeze ya bịa, nakwa ka e mee uche ya n’ụwa. Ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna, kọwaara nwa gị uru ihe ndị e kwuru n’ekpere a bara. Jizọs ekweghị ka Setan mee ka ọ kwụsị ife Chineke. Jizọs họọrọ ndịozi ya, ha aghọọ ndị mbụ n’ime ndị ga-eso ya chịa n’Alaeze Chineke. Mee ka ọ ghọta na Jizọs ejighị ife Chineke gwuo egwu. Jizọs chọrọ inyere ndị mmadụ aka. Ọ bụ ya mere o ji gwọọ ndị ọrịa, nye ndị agụụ ji nri, kpọlitekwa ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ. O ji ọrụ ebube ndị a ọ rụrụ gosi ihe Alaeze Chineke ga-emere ndị mmadụ.

NÁ NKEBI A

ISI NKE 74

Jizọs Aghọọ Mezaya

Olee ihe Jọn bu n’obi kwuo na Jizọs bụ Nwa Atụrụ Chineke?

ISI NKE 75

Ekwensu Anwaa Jizọs Ọnwụnwa

Ekwensu nwara Jizọs ọnwụnwa ugboro atọ. Gịnị bụ ihe ndị o ji nwaa Jizọs? Olee ihe Jizọs mere?

ISI NKE 76

Jizọs Emee Ka Ụlọ Nsọ Dị Ọcha

Gịnị mere Jizọs ji chụpụ atụrụ na ehi n’ụlọ nsọ ma kpuo tebụl nke ndị na-agbanwe ego ihu?

ISI NKE 77

Otu Nwaanyị Abịa Isere Mmiri n’Olulu Mmiri

O juru otu nwaanyị Sameria anya na Jizọs na-agwa ya okwu. Gịnị mere o ji ju ya anya? Olee ihe Jizọs gwara ya nke ọ na-agwatụbeghị onye ọ bụla?

ISI NKE 78

Jizọs Amalite Ikwusa Ozi Ọma Alaeze Chineke

Jizọs gwara ụfọdụ ndị na-eso ụzọ ya ka ha bụrụ “ndị na-akụta mmadụ.” O mechara kụziere ndị na-eso ụzọ dị iri asaa ikwusa ozi ọma.

ISI NKE 79

Jizọs Arụọ Ọtụtụ Ọrụ Ebube

Ebe ọ bụla Jizọs gara, ndị ọrịa na-abịakwute ya ka ọ gwọọ ha, ya agwọọ ha. Ọ kpọlitedịrị otu nwatakịrị nwaanyị n’ọnwụ.

ISI NKE 80

Jizọs Ahọrọ Ndịozi Iri na Abụọ

Gịnị mere o ji họrọ ndịozi iri na abụọ ahụ? Ị̀ ma aha ha?

ISI NKE 81

Ihe Jizọs nọ n’Elu Ugwu Kụzie

Jizọs kụziiri ìgwè mmadụ bịakwutere ya ihe ndị bara uru.

ISI NKE 82

Jizọs Akụziere Ndị Na-eso Ụzọ Ya Otú E Si Ekpe Ekpere

Olee ihe ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-arịọ Chineke?

ISI NKE 83

Jizọs Enye Ọtụtụ Puku Mmadụ Nri

Gịnị ka ọrụ ebube a na-akụziri anyị banyere Jizọs na Jehova?

ISI NKE 84

Jizọs Agaa Ije n’Elu Mmiri

Olee otú i chere obi dị ndịozi Jizọs mgbe ha hụrụ ka Jizọs na-aga ije n’elu mmiri?

ISI NKE 85

Jizọs Agwọọ Mmadụ n’Ụbọchị Izu Ike

Gịnị mere na ọ bụghị mmadụ niile ka obi dị mma n’ihe a o mere?

ISI NKE 86

Jizọs Akpọlite Lazarọs n’Ọnwụ

Mgbe Jizọs hụrụ Meri ka ọ na-ebe ákwá, o bewekwara ákwá. Ma, obere oge, obi malitere ịtọ ha ụtọ.