Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe A Na-aga Ịkọ ná Nkebi nke 14

Ihe A Na-aga Ịkọ ná Nkebi nke 14

Ndị Kraịst oge mbụ ziri ozi ọma Alaeze Chineke ruo n’ebe kacha anya n’ụwa. Jizọs gwara ha ebe ndị ha ga-ekwusa ozi ọma. Ọ rụrụ ọrụ ebube mee ka ha zie ndị mmadụ ozi ọma n’asụsụ ha. Jehova mere ka ha kwusaa ozi ọma na-atụghị ụjọ, nyekwa ha ike ha ji die nsogbu ndị mmadụ nyere ha.

Jizọs gosiri Jọn onyeozi ebube Jehova n’ọhụụ. N’ọhụụ ọzọ, Jọn hụrụ ka Alaeze Chineke meriri Setan ma bibie ọchịchị ya ruo mgbe ebighị ebi. Jọn hụkwara ka Jizọs na otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ ya na ha ga-eso achị, na-achị ụwa. Ọ hụrụ ka e mere ka ụwa niile ghọọ paradaịs, ndị niile bi na ya ana-efe Jehova, birikwa n’udo.

NÁ NKEBI A

ISI NKE 94

Ndị Na-eso Ụzọ Jizọs Enweta Mmụọ Nsọ

Olee ọrụ ebube mmụọ nsọ nyere ha ikike ịrụ?

ISI NKE 95

O Nweghị Ihe Ga-emeli Ka Ha Kwụsị Izi Ozi Ọma

Ndị ndu okpukpe gburu Jizọs, na-achọkwa ka ndị na-eso ụzọ ya kwụsị izi ozi ọma, ma ha agaghị akwụsịli ha.

ISI NKE 96

Jizọs Ahọrọ Sọl

Sọl bụ ezigbo onye iro nke Ndị Kraịst. Ma, o teghị aka ihe agbanwee.

ISI NKE 97

Kọnịliọs Enweta Mmụọ Nsọ

Gịnị mere Chineke ji gwa Pita ka ọ gaa n’ụlọ nwoke na-abụghị onye Juu?

ISI NKE 98

Otú Ozi Ọma Si Ruo n’Ọtụtụ Obodo

Pọl onyeozi na ndị ya na ha so bidoro ikwusa ozi ọma n’obodo ndị dị anya.

ISI NKE 99

Onye Na-elekọta Ụlọ Mkpọrọ Aghọọ Onye Kraịst

Olee ihe a kọrọ gbasara mmụọ ọjọọ, ala ọma jijiji nakwa mma agha n’akụkọ a?

ISI NKE 100

Pọl na Timoti

Ha abụọ bụ enyi, sorokwa jee ozi ọma ruo ọtụtụ afọ.

ISI NKE 101

A Kpọọrọ Pọl Gaa Rom

Ọtụtụ nsogbu bịaara Pọl onyeozi mgbe ọ na-aga ozi ọma n’ebe dị iche iche, ma o meghị ka ọ kwụsị.

ISI NKE 102

Ọhụụ Ndị E Gosiri Jọn

Jizọs gosiri Jọn ọhụụ dị iche iche gbasara ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu.

ISI NKE 103

“Ka Alaeze Gị Bịa”

Ọhụụ ndị e gosiri Jọn, gosiri otú Alaeze Chineke ga-esi mee ka ihe dị mma n’ụwa.