Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ABỤ NKE 5

Ọrụ Chineke Dị Ebube

Ọrụ Chineke Dị Ebube

(Abụ Ọma 139)

  1. 1. Nna, naanị gị bụ Chineke. Ọ dịgh’ihe zor’ezo n’anya gị.

    Ị n’enyocha ihe niile dịm n’obi.

    Ihem n’ekwu n’ihem n’eme

    doro gịa-nya.

    Amam n’ị hụr’ọkpụkpụm niile.

    Ị hụrụ ha n’ogem nọ n’im’afọ.

    Ị hụr’ahụ́m; i dere ya n’akwụkwọ.

    M n’eto gị maka

    n’ọrụ gị dịe-bube.

    Amamihe n’ike gị dịkw’ebube.

    Mkpụr’obim ma n’ị bụ Chineke.

    Ụjọ jidem n’ọchịchịrị g’ekpuchim,

    Ị ga n’eji ’mụọn-sọ n’ekpuchitem.

    Nna, eb’ọ bụlam gbabara,

    Amaaram na ị g’ahụm n’eb’ahụ,

    M’ọ bụ n’ili m’ọ bụ n’ime el’igwe,

    M’ọ bụ n’ọchịchịrị

    m’ọ bụ n’osimiri.