Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ABỤ NKE 45

Ihe M Na-atụgharị n’Uche

Ihe M Na-atụgharị n’Uche

(Abụ Ọma 19:14)

  1. 1. Nna, biko nyerem aka.

    Biko, mee k’ihe dịm n’obi

    Bụrụ ihe n’amasị gị,

    Kam nọsi’ike n’ọgbakọ gị.

    E nwee ihe n’echum ụra,

    Ihe n’agbawakwam obi,

    Biko, mee kam n’echeta gị,

    Mee kam cheta ihe dịm-ma.

  2. 2. Biko, kam chet’eziokwu gị,

    Cheta ihe n’amasị gị,

    Ihe niile bụi-he dịm-ma,

    K’o mee k’obi n’erum ala.

    Nna, echiche gị dịm-ma.

    Anyị agagh’amacha ya.

    Biko, mee kam tụgharị’uche

    N’ihe niile dị n’Okwu gị.