Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ABỤ NKE 46

Anyị Na-ekele Gị, Jehova

Anyị Na-ekele Gị, Jehova

(1 Ndị Tesalonaịka 5:18)

  1. 1. Anyị n’asị gị, Jehova, i meela.

    I ji Okwu gị mee k’anyị h’ụzọ.

    Ezi Chineke, anyị ga n’eto gị

    N’anyị nwer’ike ịgwa gịm-kp’anyị.

  2. 2. Anyị n’asị gị, Jehova, i meela.

    Jizọs jer’ozi ma merie ụwa.

    I ji ’mụọn-sọ gị n’edua-nyị kw’ụbọchị.

    I mere k’anyị n’emezun-kw’anyị.

  3. 3. Anyị n’asị gị, Jehova, i meela.

    Anyị n’ekwusa aha gị n’ụwa.

    Anyị n’eto gị makan-kwa i kwere

    N’anyị g’enweta ndụe-bigh’ebi.