ABỤ NKE 66
Na-ekwusa Ozi Ọma
-
1. Jehova chọrọ ka ’madụ niile mụta
Eziokwu g’eme ka ha niile nwetan-dụ.
O mere kan-dị ’madụ mata Mezaya.
O chetara n’ụmụ ’madụ bụn-dịm-mehie.
O kpebiri n’Ọkpara ya ga n’achịụ-wa,
N’ọchịchị ya g’ebido n’el’igwe n’oge ya.
Ọ g’eme kan-dịe tere ’manụ dịe-bube.
Ọkpara ya g’alụkwa ha ka nwunye ya.
-
2. E bur’amụma n’anyị g’ekwus’oziọ-ma.
Jehova chọrọ k’anyị n’ekwusa y’ugbua.
Ndị ’mụ’ozi soa-nyị n’aga n’ekwusa ya.
K’anyị n’aga n’ụlọ n’ụlọ n’ekwusa ya.
K’anyị niile n’agbalị n’eto Chineke.
Oziọ-ma bụọ-rụ kach’ọrụ niile dị n’ụwa.
Anyị ga n’enw’ọṅụ n’anyị so n’ekwusa
Oziọ-ma g’eme kan-dị ’madụ nwetan-dụ.
(Gụọkwa Mak 4:11; Ọrụ 5:31; 1 Kọr. 2:1, 7.)