Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ABỤ NKE 67

Kwusaa Okwu Chineke

Kwusaa Okwu Chineke

(2 Timoti 4:2)

  1. 1. Chineke nyer’any’iwu taa.

    Ọ gwar’anyị n’ekwusa oziọ-ma.

    K’anyị n’ekwusa n’oge niile

    Olileanya Chineke nyer’anyị.

    (UKWE)

    Kwusaanụ ya

    Ka ’madụ niile nụ ya.

    Kwusaa ya.

    Ọgwụgw’ụwa n’erun-so.

    Kwusaa ya.

    Mee ka ha ghọt’eziokwu.

    Kwusaa ya

    N’ụwa niile.

  2. 2. Anyị ma n’a g’akpagbua-nyị.

    Ọ n’eme k’ihere mewe ’madụ.

    Ha sị k’anyị kwụsị oziọ-ma,

    Anyị g’atụkwasị Chinek’obi.

    (UKWE)

    Kwusaanụ ya

    Ka ’madụ niile nụ ya.

    Kwusaa ya.

    Ọgwụgw’ụwa n’erun-so.

    Kwusaa ya.

    Mee ka ha ghọt’eziokwu.

    Kwusaa ya

    N’ụwa niile.

  3. 3. Eziokwu k’anyị n’ekwusa.

    K’anyị jir’oge dịm-ma kwusaa ya.

    Anyị n’ekwusa nzọpụta.

    Anyị n’edokw’aha Jehovan-sọ.

    (UKWE)

    Kwusaanụ ya

    Ka ’madụ niile nụ ya.

    Kwusaa ya.

    Ọgwụgw’ụwa n’erun-so.

    Kwusaa ya.

    Mee ka ha ghọt’eziokwu.

    Kwusaa ya

    N’ụwa niile.