Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ABỤ NKE 117

Ịdị Mma

Ịdị Mma

(2 Ihe E Mere 6:41)

  1. 1. Nar’ekele, Chinek’anyị.

    Ị dịm-ma ru’ebigh’ebi.

    Ị dịkwan-sọ, n’ekwue-ziokwu.

    Ụzọ gị niile dịm-ma.

    Ị n’emere ’madụ niile

    Ebere n’enwegh’atụ.

    Ọ bụ gị k’e kwesịr’ife.

    Anyị niile n’efe gị.

  2. 2. I nyer’anyị ndịo-kenye.

    I ji ha n’eduzia-nyị.

    Eziokwu gị n’omume ha

    N’egosia-nyị n’ị dịm-ma.

    Eziokwu gị nan-dịo-kenye

    N’akp’ike n’ọtụtụm-ba.

    Nna, biko nyea-nyị ’mụọn-sọ.

    Anyị ga n’eṅomi gị.

  3. 3. Ụmụnn’anyị dịa-nyị n’obi.

    Mee k’anyị nyere h’aka.

    K’anyị hụ ha niile n’anya,

    N’ahụkwan-dịọ-zọ n’anya.

    N’ụl’ọ bụla, nám-b’ọ bụla,

    N’ọgbak’ọ bụla ha si,

    Jiri ’mụọ gị n’akwadoa-nyị

    K’anyị n’enyere h’aka.